Abụ Ọma 32:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 32 Onye Chineke gbaghaara ihe ọjọọ o mere, ya bụ, onye e kpuchiri* mmehie ya, na-enwe obi ụtọ.+ Abụ Ọma 51:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 51 Chineke, biko, meere m amara n’ihi ịhụnanya gị.*+ Hichapụ mmehie m n’ihi na ebere gị dị ukwuu.+ Abụ Ọma 103:2, 3 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Ka m* too Jehova. Ka a ghara inwe mgbe m ga-echefu ihe niile o mere.+ 3 Ọ na-agbaghara gị mmehie gị niile,+Ọ na-agwọkwa gị ọrịa gị niile.+ Aịzaya 1:18 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 Jehova kwuru, sị: “Bịanụ ka anyị kpezie.+ Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie,M ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.+ Ọ bụrụgodị na ọ na-acha ọbara ọbara ka ákwà uhie,Ọ ga-adị ka ajị ọcha. Aịzaya 43:25 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 25 Ọ bụ m bụ Onye na-ehichapụ mmehie unu*+ n’ihi aha m.+ Agaghịkwa m echeta mmehie unu.+ Aịzaya 44:22 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 22 M ga-ekpuchi ajọ omume gị ka à ga-asị na e ji ígwé ojii kpuchie ya,+Kpuchiekwa mmehie gị ka à ga-asị na e ji ígwé ojii kpuchie ya. Lọghachikwute m, n’ihi na m ga-agbapụta gị.+
2 Ka m* too Jehova. Ka a ghara inwe mgbe m ga-echefu ihe niile o mere.+ 3 Ọ na-agbaghara gị mmehie gị niile,+Ọ na-agwọkwa gị ọrịa gị niile.+
18 Jehova kwuru, sị: “Bịanụ ka anyị kpezie.+ Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie,M ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.+ Ọ bụrụgodị na ọ na-acha ọbara ọbara ka ákwà uhie,Ọ ga-adị ka ajị ọcha.
22 M ga-ekpuchi ajọ omume gị ka à ga-asị na e ji ígwé ojii kpuchie ya,+Kpuchiekwa mmehie gị ka à ga-asị na e ji ígwé ojii kpuchie ya. Lọghachikwute m, n’ihi na m ga-agbapụta gị.+