Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Matiu 17:1-8
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 17 Mgbe ụbọchị isii gachara, Jizọs kpọọrọ Pita na Jems na Jọn nwanne ya gbagoo n’ugwu dị oké elu.+ 2 O wee nwoghaa n’ihu ha, ihu ya achawa ka anyanwụ, uwe elu ya ana-enwukwa gbaa* dị ka ìhè.+ 3 Ma, Mosis na Ịlaịja pụtara n’ihu ha, ha na ya ana-akparịta ụka. 4 Pita wee sị Jizọs: “Onyenwe anyị, ọ dị mma na anyị nọ ebe a. Ị chọọ, m ga-ama ụlọikwuu atọ ebe a, otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Ịlaịja.” 5 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ígwé ojii na-enwu gbaa kpuchiri ha, otu olu esikwa n’ígwé ojii ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.+ Geenụ ya ntị.”+ 6 Mgbe ha nụrụ ihe a, ndị na-eso ụzọ ya gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, ezigbo ụjọ wee jide ha. 7 Jizọs wee bịa, bitụ ha aka, sị: “Bilienụ. Unu atụla egwu.” 8 Mgbe ha leliri anya, e nweghịzi onye ha hụrụ ma e wepụ Jizọs.

  • Mak 9:2-8
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 2 Mgbe ụbọchị isii gachara, Jizọs kpọọrọ Pita na Jems na Jọn gbagoo n’ugwu dị elu. O wee nwoghaa n’ihu ha.+ 3 Uwe elu ya malitere igbuke egbuke, na-enwu gbaa karịa otú onye ọ bụla na-asụ ákwà n’ụwa a nwere ike ịsụ ákwà ka ọ dị ọcha. 4 Ịlaịja na Mosis pụtakwara n’ihu ha, ha na Jizọs nọ na-akparịta ụka. 5 Pita wee sị Jizọs: “Onye Ozizi,* ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a. N’ihi ya, ka anyị maa ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Ịlaịja.” 6 N’eziokwu, Pita amaghị ihe ọ ga-eme n’ihi na ezigbo ụjọ ji ha. 7 Ígwé ojii pụtara wee kpuchie ha. Otu olu+ sikwa n’ígwé ojii ahụ kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya.+ Geenụ ya ntị.”+ 8 Na mberede, ha legharịrị anya ma hụ na e nweghịzi onye ha na ya nọ ma e wepụ Jizọs.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya