-
Luk 24:25-27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 N’ihi ya, ọ sịrị ha: “Unu ndị na-amaghị ihe, ndị obi ha kpọchikwara akpọchi, gịnị mere unu ekwereghị ihe niile ndị amụma kwuru? 26 Ọ̀ bụ na ihe ndị a ekwesịghị ime Kraịst,+ ka e nwee ike ime ka ọ dị ebube?”+ 27 Ọ kọwaara ha ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ gbasara onwe ya, malite n’ihe Mosis dere ruo n’Akwụkwọ Ndị Amụma niile.+
-