-
Mak 12:26, 27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 Ọ̀ bụ na unu agụbeghị akụkọ osisi ogwu ahụ n’akwụkwọ Mosis? Chineke na-ekwu banyere ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite n’ọnwụ mgbe ọ gwara Mosis, sị: ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’+ 27 Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ. N’eziokwu, unu efuola ụzọ.”+
-