14 Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri m ga-enye ya, mmiri agakwaghị agụ ya ọzọ,+ kama mmiri m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke na-asọpụta mmiri na-enye ndụ ebighị ebi.”+
37 N’ụbọchị ikpeazụ, nke bụ́ nnukwu ụbọchị n’ememme ahụ,+ Jizọs guzoro ọtọ ma jiri oké olu kwuo, sị: “Ọ bụrụ na mmiri na-agụ onye ọ bụla, ya bịakwute m ṅụọ mmiri.+
17 Mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị, “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa, “Bịa!” Onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịa.+ Onye ọ bụla nke chọrọ, ya bịa ṅụọ mmiri nke ndụ n’efu.+