7 Ma, ana m agwa unu eziokwu, ọ bụ ka ihe dịrị unu ná mma mere m ji ala. N’ihi na ọ bụrụ na alaghị m, ihe inyeaka ahụ+ agaghị abịakwute unu. Ma ọ bụrụ na mụ alaa, m ga-ezitere unu ya.
17 ‘Chineke kwuru, sị, “N’oge ikpeazụ, m ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị mmadụ ọ bụla. Ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị ga-ebukwa amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ, ndị agadi nwoke unu ga-arọkwa nrọ.+