-
Jọn 11:2-4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Ọ bụ Meri a bụ onye tere Onyenwe anyị mmanụ na-esi ísì ọma ma jiri ntutu isi ya hichaa ụkwụ ya.+ Ọ bụkwa ya ka Lazarọs nwanne ya nwoke na-arịa ọrịa. 3 Ụmụnne Lazarọs ndị nwaanyị wee zigara Onyenwe anyị ozi, sị: “Onyenwe anyị, onye ị hụrụ n’anya na-arịa ọrịa.” 4 Ma mgbe Jizọs nụrụ ya, ọ sịrị: “Ihe ga-esi n’ọrịa a pụta abụghị ọnwụ, kama ọ bụ ka e too Chineke,+ ka e wee si na ya too Ọkpara Chineke.”
-