4 Mgbe ọ kwụsịrị ịgwa ìgwè mmadụ ahụ okwu, ọ sịrị Saịmọn: “Kwọrọ ụgbọ a banye n’ebe miri emi, wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu gbute azụ̀.” 5 Ma Saịmọn sịrị ya: “Onye Ozizi, n’agbanyeghị anya niile anyị mụrụ n’abalị, anyị egbuteghị ihe ọ bụla.+ Ma, ebe ị sị m wụnye ụgbụ na mmiri, m ga-awụnye ya.”