3 E nwere otu nwoke onye Farisii aha ya bụ Nikọdimọs.+ Ọ bụ otu n’ime ndị isi ndị Juu. 2 Ọ bịakwutere Jizọs n’abalị,+ sị ya: “Rabaị,+ anyị ma na ị bụ onye ozizi Chineke zitere n’ihi na e nweghị onye ga-arụli ọrụ ebube ndị a+ ị na-arụ ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”+