18 N’ihi ya, otú ahụ otu mmehie mere ka a maa ụdị mmadụ niile ikpe,+ otú ahụkwa ka otu ezi omume si eme ka a na-akpọ ụdị mmadụ niile+ ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.+
3 Ihe Iwu ahụ* na-enweghị ike ime+ maka na anụ ahụ́ adịghị ike+ ka Chineke mere. Otú o si mee ya bụ na o zitere Ọkpara ya+ ka ọ dịrị ka ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-eme mmehie,+ ka o wee wepụ mmehie. O si otú a na-ama mmehie dị ụmụ mmadụ n’ahụ́ ikpe,
19 N’ihi na Iwu ahụ* emeghị ka ihe ọ bụla zuo okè,+ ma olileanya ka mma+ anyị nwere ugbu a mere ka ihe zuo okè. Anyị sikwa na ya na-abịaru Chineke nso.+