-
Ọrụ Ndịozi 28:3-6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Ma mgbe Pọl buuru otu ùkwù nkụ tụkwasị n’ọkụ ahụ, otu ajụala si na nkụ ahụ pụta n’ihi ọkụ ahụ ma gbakụọ ya n’aka. 4 Mgbe ndị ebe ahụ hụrụ agwọ ahụ gbakụrụ ya n’aka, ha malitere ịgwa ibe ha, sị: “N’eziokwu, nwoke a bụ ogbu mmadụ. Ọ bụ eziokwu na o si n’oké osimiri pụta n’enweghị ihe mere ya, ihe o metara* ga-egburịrị ya.” 5 Ma, o febara agwọ ahụ n’ime ọkụ, o nweghịkwa ihe mere ya. 6 Ma ha nọ na-atụ anya na aka ya ga-aza ma ọ bụ na ọ ga-ada na mberede nwụọ. Mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha, malite ịsị na ọ bụ chi.
-