11 Ọ karịbeghị abalị iri na abụọ m gara Jeruselem ka m fee Chineke. Ị chọọ, i nwere ike ịchọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu.+ 12 O nweghị mgbe ha hụrụ m ka mụ na onye ọ bụla na-arụ ụka n’ụlọ nsọ ma ọ bụ ka m na-eme ka ndị mmadụ na-akpa aghara n’ụlọ nzukọ ọ bụla ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ na Jeruselem.