38 N’ihi na onye ọ bụla ihere ịbụ onye na-eso ụzọ m na ihere okwu m na-eme n’ọgbọ a hapụrụ Chineke,* nke na-emekwa mmehie, ihere onye ahụ ga-eme Nwa nke mmadụ+ mgbe ọ ga-abịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”+
8 N’ihi ya, ka ihere ịgba àmà banyere Onyenwe anyị ghara ime gị,+ ka ihere gharakwa ime gị maka na a tụrụ m mkpọrọ n’ihi Onyenwe anyị. Kama, ka obi sie gị ike na Chineke ga-enye gị ike+ idi ahụhụ a ga-ata gị+ n’ihi ozi ọma ị na-ezisa.