8 Na-echenụ echiche nke ọma, na-echekwanụ nche.+ Ekwensu, bụ́ onye iro unu, na-ejegharị ka ọdụm na-agbọ ụja, na-achọ onye ọ ga-eri.+ 9 Ma na-alụsonụ ya ọgụ,+ siekwanụ ike n’okwukwe, ebe unu ma na ụmụnna unu niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a unu na-ata.+