8 N’ihi na ọ hụrụ na ndị Izrel na-eme ihe na-adịghị mma. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Jehova* kwuru, sị, ‘Oge na-abịa mgbe mụ na ndị Izrel na ndị Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ.
15 Ọ bụ ya mere o ji bụrụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ,+ ka e wee kwe ndị a kpọrọ nkwa na ha ga-enweta ngọzi* na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Ihe niile a nwere isi n’ihi ọnwụ ya nke e si na ya gbapụta ha+ ma tọhapụ ha ná mmehie ndị ha na-eme n’ọgbụgba ndụ mbụ ahụ.