19 Enwere m olileanya na m ga-ezitere unu Timoti+ n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ uche Onyenwe anyị Jizọs, ka e wee gbaa m ume mgbe m ga-anụ gbasara unu. 20 N’ihi na enweghị m onye ọzọ nwere ụdị obi o nwere, onye ga-eji obi ya niile lebara mkpa unu anya.