7 n’ihi na iche banyere ihe ga-adị anụ ahụ́ mma na-eme ka mmadụ bụrụ onye iro Chineke,+ maka na anụ ahụ́ anaghị erubere iwu Chineke isi. N’eziokwu, ọ gaghị erubere ya isi. 8 N’ihi ya, ndị na-ebi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ agaghị emeli ihe dị Chineke mma.