-
1 Timoti 6:3-5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-akụzi ihe dị iche n’ihe a, ọ bụrụkwa na onye ahụ ekwereghị eziokwu a na-akụziri anyị,*+ nke si n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ma ọ bụ na o kwereghị ihe a na-akụziri anyị gbasara otú anyị kwesịrị isi na-efe Chineke,+ 4 ọ dị mpako, ọ naghịkwa aghọta ihe ọ bụla.+ Ihe ọ na-emekwa mgbe niile bụ ise okwu na ịrụ ụka.+ Ihe ndị a na-eme ka mmadụ na-eme anyaụfụ, na-ese okwu, na-ekwutọ ndị ọzọ,* na-enyokwa ha enyo. 5 Ọ na-emekwa ka ndị obi ha na-adịghị ọcha,+ ndị jụkwarala eziokwu, na-esekarị okwu n’ihi ihe ndị na-abaghị uru. Naanị ihe mere ụdị ndị a ji na-achọ ife Chineke bụ uru ha ga-erite.+
-