-
Ndị Rom 16:25, 26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Ozi ọma m na-ezisa na ozi m na-ekwusa banyere Jizọs Kraịst gosiri na Chineke ga-emeli ka unu guzosie ike. Ozi ọma a dabara n’ihe dị nsọ e kpughere nke e zoro ezo+ kemgbe oge dị anya. 26 Ma, e meela ka a mata* ya ugbu a. E jirikwala amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ mee ka mba niile mata ya. Ihe a dabara n’iwu Chineke onye na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi nyere ka mba niile wee nwee okwukwe na ya ma na-erubere ya isi.
-