-
Ọrụ Ndịozi 16:22-24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 Mmadụ niile nọ ebe ahụ wee jiri iwe gwa ha okwu. Ndị isi obodo ahụ dọkara uwe ha yi, kwuokwa ka a pịa ha ụtarị.+ 23 Mgbe ha tikachara ha ahụ́, ha kpọchiri ha n’ụlọ mkpọrọ, gwakwa onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ka o chee ha nche ka ha ghara ịgbapụ.+ 24 N’ihi ihe a a gwara ya, ọ kpọchiri ha n’ụlọ mkpọrọ dị n’ime ime ma tụọ ha ọtọsị n’ụkwụ.
-