24 N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-anụ okwu m ma kwere n’Onye ahụ zitere m ga-enweta ndụ ebighị ebi,+ a gaghịkwa ekpe ya ikpe, kama o sila n’ọnwụ fere ná ndụ.+
2 (N’eziokwu, e mere ka ndụ ahụ pụta ìhè. Anyị ahụla ya ma na-agba àmà ya,+ na-akọkwara unu banyere ndụ ebighị ebi ahụ+ nke si n’aka Nna anyị, nke e mere ka ọ pụta ìhè n’ebe anyị nọ.)