22 M ga-apụta n’ihu gị n’ebe ahụ wee si n’elu okwuchi igbe ahụ+ gwa gị okwu. M ga-esi n’agbata cherob abụọ ahụ dị n’elu igbe ọgbụgba ndụ* ahụ mee ka ị mara ihe niile m ga-enye gị n’iwu ka ị gwa ndị Izrel.
89 Mgbe ọ bụla Mosis banyere n’ụlọikwuu nzute ka ya na Chineke* kwuo okwu,+ ọ na-anụ olu si n’elu okwuchi+ igbe ọgbụgba ndụ,* n’agbata cherob abụọ ahụ,+ na-akpanyere ya ụka. Chineke na-agwa ya okwu.