3 Ma okwu ọ bụla nke yiri ka ò si n’aka Chineke, nke na-anaghị egosi na Jizọs bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa, esighị n’aka Chineke.+ Ọ bụkwa ya bụ okwu si n’aka onye na-emegide Kraịst, onye unu nụrụ na ọ na-abịa.+ Ugbu a, ọ nọrọla anọrọ n’ụwa.+
7 N’ihi na ọtụtụ ndị nduhie abanyela n’ụwa,+ ndị na-anaghị ekweta na Jizọs Kraịst bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa.*+ Ọ bụ onye a bụ onye nduhie na onye na-emegide Kraịst.+