Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 3/8 p. 22-23
  • Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi Russia Etoo Ndịàmà Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi Russia Etoo Ndịàmà Jehova
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndịàmà Jehova Nọ na Russia—Echiche Onye Ọka Mmụta Okpukpe
    Teta!—1997
  • ‘Ụwa Anyị Ga-adị Iche’
    Teta!—2000
  • Ndị Jehova Emerie N’ikpe E kpewere Kemgbe Ọtụtụ Afọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Nke Mbụ Otu Narị Afọ Gara Aga
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 3/8 p. 22-23

Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi Russia Etoo Ndịàmà Jehova

A RAARA ihe owuwu alaka Ndịàmà Jehova dị na Russia nye na June 21, 1997. Usoro ihe owuwu ahụ gụnyere ebe obibi asaa, otu nnukwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, otu ụlọ a na-anọ eri ihe, otu akatamkpo ụlọ maka ọfịs na ebe a na-akwasa ihe. Ọ dị n’ihe dị ka kilomita 40 n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke ebe ugwu St. Petersburg, n’obodo nta Solnechnoye.

Ndị odeakụkọ a kpọrọ òkù ịbịa ihe omume ahụ kpọsara nraranye ahụ n’ụzọ dị ukwuu. Otu n’ime ha dere na Literaturnaya gazeta nke Moscow, bụ́ akwụkwọ akụkọ nwere nkesa nke ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu nde, sị: “Mmetụta mbụ mmadụ ga-enwe mgbe ọ hụrụ ya bụ, “Nke a bụ kpọmkwem ụzọ e si eme ya!”

Onye dere ihe ahụ, bụ́ Sergey Sergiyenko, kọwara, sị: “Ọ bụ ndị kwere ekwe ji aka ha rụọ ihe nile dị ebe a: Ndị bụ isi rụrụ ọrụ ihe owuwu ahụ bụ ndị Finland, ndị Sweden, ndị Denmark, ndị Norway, na ndị Germany. Ụzọ dị ọcha e ji brick rụọ; ala ndị a sụchasịrị asụchasị; usoro ihe owuwu nwere elu ụlọ tile yiri ihe e ji egwuri egwu, akatamkpo window, na ọnụ ụzọ ndị e ji enyo rụọ—nke a bụ ebe nlekọta ọrụ maka òtù okpukpe ógbè Russia nke Ndịàmà Jehova.”

A kpọrọ ndị odeakụkọ si Moscow, nke dị n’ebe karịrị kilomita 650 n’akụkụ ndịda nke ebe ọwụwa anyanwụ nke alaka ahụ, òkù ịbịa nraranye ahụ, a gbakwaara ha ụgbọ. E dugharịrị ha n’ihe owuwu ahụ, mgbe e mesịkwara, e nwere oge ajụjụ na azịza, bụ́ oge e nyere ihe ntụrụndụ. Na-adabere n’ihe ndị ọ hụgasịrị, Maazị Sergiyenko dere, sị:

“Ndịàmà, dị ka a na-ekwu ya, bụ ndị dị obi umeala na ndị na-adịghị okomoko . . . N’ikwu okwu Russia a ma ama n’ụzọ ọzọ, ‘Ndịàmà bi [n’ụlọ ha] dị ka a ga-asị na ha nọ n’obi Jehova.’ . . . Ọ bụ ezie na Ndịàmà na-egosikarị mmadụ nile obiọma, ha na-egosi ụmụnna ha nlebara anya pụrụ iche.”

Otu isiokwu nke S. Dmitriyev dere pụtara na Moskovskaya Pravda, bụ́ akwụkwọ akụkọ a na-ebi kwa ụbọchị nke nwere nkesa nke ihe fọrọ nke nta ka o ruo 400,000. N’isiokwu ya bụ́ “Ị Pụrụ Nnọọ Iji Aka Gị Wuo Ụwa nke Gị,” onye ahụ dere ya kọwara, sị:

“Mgbe e nyesịrị òtù okpukpe Ndịàmà nkwado iwu na Russia [na 1991], ajụjụ maka iwu isi ụlọ ọrụ ha bilitere. Ha nọ na-achọ ebe dị nso na Moscow mgbe akụkọ a na-atụghị anya ya bịara na a na-ere ókèala nke ebe bụbu ogige ndị ntorobịa dị St. Pete[rsburg] nso ere. A zụrụ ala ahụ, ha malitekwara iwu ihe. . . .

“Otu afọ na ọkara gara aga, na January 1, 1996, ogige ahụ dị n’obodo nta nke Solnechnoye ghọrọ alaka e ji eme ihe nke òtù okpukpe ahụ. N’etiti June, site n’ịnọ oge ụfọdụ na St. Pete[rsburg], o kwere otu ìgwè ndị odeakụkọ omume ịnwa ịchọpụta, Olee ndị Ndịàmà Jehova a bụ?”

Gịnị bụ azịza Maazị Dmitriyev? “Ụmụ mmadụ, dị ka ndị ọ bụla ọzọ.” Ma, ha dị iche, dị ka ọ rịbara ama ná ngwụsị nke isiokwu ya, sị: “Ha na ibe ha dị n’udo, udo dị ebe nile. Ọ̀ bụ nrọ? Ee. Ma ọ dị adị.”

Onye odeakụkọ ọzọ si Moscow, bụ́ Maksim Yerofeyev, nke na-edere Sobesednik ihe, bụ́ otu akwụkwọ akụkọ nwere nkesa nke ihe karịrị 300,000, kwuru, sị: “Mmekọrịta nile dị n’obere ógbè a dabeere n’ụkpụrụ na-esonụ: Ọ dịghị onye a na-amanye ịrụ ọrụ, ma onye ọ bụla na-arụ ọrụ.”

Mgbe ọ kọwasịrị ebe obibi nke onye nchịkọta ọrụ nke Kọmitii Alaka ahụ, bụ́ Vasily Kalin, Maazị Yerofeyev rịbara ama, sị: “Òtù ndị nta akụkọ anyị na-adịghị atụkwasị ihe obi chọrọ ileta ebe obibi ụfọdụ ọzọ ha họọrọ. Otú ebe obibi ndị ọzọ hà n’ibu na ihe ndị e tinyere n’ime ha adịchaghị iche pụọ ná nhazi ihe kwesịrị ekwesị dị n’ebe obibi Vasily Kalin.”

Onye nta akụkọ ọzọ, bụ́ Anastasiya Nemets, dere isiokwu bụ́ “Mmadụ Inwe Udo n’Ime Onwe Ya.” Isiokwu nta e nwere n’isiokwu ahụ dị na Vechernyaya Moskva bụ: “Nke A Bụ Ihe Ụmụ Mmadụ Na-amụta n’Obodo Nta Pụrụ Iche Dị ná Mpụga St. Pete[rsburg].”

N’ịkọwa ebe na ọdịdị nke ihe owuwu alaka ahụ, o dere, sị: “N’ebe nile, e nwere oké ọhịa na ala ahịhịa. Ọwara Oké Osimiri Finland adịghị anya. N’ebe a e nwere obere ụlọ ndị dị ọcha a rụrụ n’ụdị nke ndị Europe, ụzọ ndị e ji brick rụọ, ndị a zachara nke ọma, na ala a kụrụ okooko osisi ndị mara mma.

“Ụlọ ọrụ ndị na-achụ nta ego na-arụ obere obodo ndị dị otú ahụ maka ‘ndị Russia bara ọgaranya.’ Otú ọ dị, ndị na-enwechaghị nnọọ ihe onwunwe bi n’obodo nta a . . . Ha na-ebi nke ọma, nke kasịkwa mkpa, ha na-ebi dị ka ndị enyi. E nwere nanị ihe dị ka mmadụ 350 n’ebe a, ndị sitere n’akụkụ nile nke ụwa; mmadụ pụrụ ịnụ ka a na-asụ asụsụ dị iche iche—malite na Spanish na Portuguese ruo Finnish na Swedish.

“N’ụzọ bụ isi, nke a bụ ntakịrị ụwa dịpụụrụ onwe ya: Obodo nta ahụ nwere ebe a na-arụpụta ma na-emezi ihe, ebe ọ pụrụ ikwe omume imepụta ihe ọ bụla dị ezinụlọ ahụ buru ibu nke na-asụ ọtụtụ asụsụ mkpa; ha nwere ọbụna ụlọ ọgwụ nke ha.”

N’ezie, nraranye ahụ bụ oge inwe ọṅụ maka 1,492 si mba 42 ndị bịaranụ na Solnechnoye. Ọtụtụ ndị bịaranụ bụ ndị agadi jeworo ozi ruo ọtụtụ iri afọ mgbe a machibidoro ọrụ nkwusa ahụ iwu. Ị̀ pụrụ iche n’echiche ịtụnanya na ọṅụ nke ndị a nọteworo aka ka ha na-agagharị n’ihe owuwu ahụ mara mma nke dị n’ebe a yiri ubi a gbara ogige dị hekta 6.9? A pụrụ ịghọta ihe mere ha ji chee na ha na-arọ nrọ.

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Ndị odeakụkọ na-agagharị n’ihe owuwu alaka ahụ

Oge ajụjụ na azịza

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya