28 ESA
O Ji Obi Ya Niile Jeere Jehova Ozi “ná Ndụ Ya Niile”
Ọ GA-ABỤRỊRỊ na ezigbo ụjọ tụrụ Eze Esa mgbe mbụ ọ hụrụ ka ìgwè ndị agha Etiopia mara ụlọikwuu na Juda ka ha lụso ha agha. E nweela ọtụtụ ugboro Jehova dunyere ndị Izrel ka ha gaa agha, ma e nwetụbeghị mgbe ha lụsoro ndị iro dị ọtụtụ otú a agha. Ndị agha Etiopia a dị otu nde (1,000,000) mmadụ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ha karịrị ndị agha Esa okpukpu abụọ. Olee otú Esa ga-esi enwe obi ike ịlụso ha agha?
Ihe a abụghị nke mbụ Esa na-egosi na o nwere obi ike. Mgbe ọ malitere ịchị Juda afọ iri tupu mgbe ahụ, o gosiri na ọ dị nnọọ ka Eze Devid bụ́ otu n’ime ndị nna ya ochie. Ọ gbara mbọ ka o mee ihe dị Chineke ya bụ́ Jehova mma. O wedara onwe ya ala gee ndị amụma Jehova, bụ́ Oded na nwa ya bụ́ Azaraya, ntị. N’agbanyeghị na ọ ka bụ okorobịa, ọ katara obi malite idozi ụfọdụ ihe na-adịghị mma dịwara kemgbe Eze Solomọn hapụrụ ife Jehova fewezie arụsị. Dị ka ihe atụ, o ji obi ike chụpụ ụmụ nwoke na-agba akwụna n’ụlọ arụsị ma bibie arụsị ndị mmadụ nọ na-efe.
Esa kwụsịkwara ihe ọjọọ ndị ezinụlọ ya nọ na-eme. E weere nne nna ya bụ́ Meaka ka “nnukwu nwaanyị,” a na-akwanyekwara ya ùgwù maka ọkwá a ọ nọ na ya. Ma, nwaanyị a mere arụsị jọgburu onwe ya. Ọ ga-abụ na ndị mmadụ na-akwa iko n’ihu arụsị a ma ha bịa ife ya. Esa agbachighị nne nna ya nkịtị maka na ha si n’otu ezinụlọ. Ọ chụtụru ya n’ọkwá ma kpọọ arụsị ahụ ọkụ. Jehova mere ka udo dị na Juda ruo afọ iri n’ihi na Esa mere ihe dị mma. Ma, gịnị ka Jehova meere Esa mgbe ahụ ndị Etiopia bịara ịlụso ndị Juda agha?
Ndị agha kacha ọtụtụ ná ndị agha niile a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bịara ịlụso Eze Esa agha
Mgbe Esa lere anya na ndagwurugwu Juda ma hụ ọtụtụ ndị agha Etiopia, ihe mbụ gbatara ya n’uche bụ ịkpọku Chineke ya. Chegodị otú obi dị ndị agha ya mgbe ha nụrụ ka ọ na-ekpe ekpere, sị: “Jehova, ị chọọ inyere ndị mmadụ aka, ị ga-enyere ha aka, ma hà dị ọtụtụ ma hà dị ole na ole, ma hà siri ike ma ọ bụ na ha esighị. Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, nyere anyị aka n’ihi na anyị tụkwasịrị gị obi. Anyị jikwa aha gị na-alụso ìgwè mmadụ a agha. Jehova, ị bụ Chineke anyị. Ekwela ka mmadụ efu merie gị.” Ọ ga-abụrịrị na ekpere a Esa ji obi ya niile kpee masịrị Jehova. Ọ chọpụtara na Esa nwere obi ike ka nwa Eze Sọl bụ́ Jonatan, onye dịrị ndụ tupu yanwa. Ụmụ nwoke abụọ a ghọtara na Jehova nwere ike iji ndị agha ole na ole merie ọtụtụ ndị iro ya. (1 Sam. 14:6) Ọ bụ onye ọ bụla Ọkaakaa eluigwe na ụwa nọnyeere ga-emeri.
Esa du ndị agha ya gawa agha. Gịnị meziri? Baịbụl kwuru ihe mere ndị ahụ bịara ịlụso ha agha, sị: “Jehova na ndị agha ya lara ha n’iyi.” O nweghị otu onye n’ime ha fọrọ ndụ.
Mgbe ihe a mechara, Esa nọgidere na-akwado ezigbo ofufe. Ọtụtụ ndị hapụrụ alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu Izrel kwaga Juda ka ha nwee ike ịna-efe Chineke ezigbo ofufe n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Esa mere ka ndị niile bi na Juda ṅụọ iyi na ha ga na-efe Jehova.
Ma, e nwekwara ihe ndị jọgburu onwe ha Esa mere. Mgbe eze Izrel chọrọ ịlụso ndị Juda agha, Esa arịọghị Jehova ka o nyere ya aka, kama, o nyere eze Siria aka azụ ka ọ gaa lụso ndị Izrel agha. Jehova zigara onye ọhụ ụzọ ma ọ bụ onye amụma aha ya bụ Hanenaị ka ọ gaa dọọ Esa aka ná ntị. Ma, Eze Esa were iwe, tụba onye amụma a n’ụlọ mkpọrọ. Mgbe Esa mere agadi, ọ rịasiwere ọrịa ike. Ma, ọ rịọghị Jehova ka o nyere ya aka, kama, ọ gara chọwa ndị na-agwọ ọrịa. Ọ ga-abụ na Esa enweghịzi okwukwe siri ike otú o nwere na mbụ.
Ma, Jehova bụ Nna kacha enwe ndidi. Lee otú Okwu ya si chịkọta ihe niile Esa mere n’ime afọ iri anọ na otu ọ bụ eze. Ọ sịrị: “O ji obi ya niile jeere Jehova ozi ná ndụ ya niile.” Ihe e si n’ike mmụọ nsọ dee banyere nwoke a e ji ama atụ na-echetara anyị na Jehova hụrụ ndị hụrụ ya n’anya n’anya. Ọ na-emekwa ka anyị mata na anyị ekwesịghị ichefu ihe ọma ndị Jehova meere anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-efe ya ma na-ahụkwu ihe ọma ndị ọ na-emere anyị, anyị ga na-enwekwu obi ike.
Gụọ akụkọ a na Baịbụl:
Ajụjụ a ga-aza:
Gịnị na gịnị ka Esa mere gosiri na o nwere obi ike?
Mụtakwuo Ihe
1. Gịnị bụ “ogwe osisi arụsị,” oleekwa otú ihe ndị ọkachamara chọpụtara si gosi na ndị kwụsịrị ife Chineke fewe arụsị fere chi nwaanyị nke ogwe osisi a nọchiri anya ya? (1 Eze 15:12, 13; w08 6/1 10 ¶1-5) A
Foto nke A: Esa chụturu nne nna ya n’ọkwá ukwu ọ nọ na ya ma bibie ogwe osisi arụsị o mere
Foto nke A: Esa chụturu nne nna ya n’ọkwá ukwu ọ nọ na ya ma bibie ogwe osisi arụsị o mere
2. Ònye ka ọ ga-abụ ya bụ nwa Hanenaị onye ọhụ ụzọ, oleekwa otú o si gosi na o nwere obi ike ka nna ya? (it “Hanenaị” Nke 2)
3. Ọ bụ eziokwu na Esa mejọrọ ihe, ma gịnị ka o mere gosiri na “o ji obi ya niile jeere Jehova ozi”? (1 Eze 15:14; w17.03 19 ¶5-6)
4. E jighị ịkpọ ozu ọkụ mara ndị Izrel. Gịnị ka 2 Ihe E Mere 16:14 kwuru na a kpọrọ ọkụ n’oge a na-eli Esa? (w05 12/1 20 ¶5)
Chebara Ihe Ndị Ị Mụtara Echiche
Ume Azaraya onye amụma gbara Esa mere ka a maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe. Olee otú okwu dị mma ị na-agwa ndị ọzọ nwere ike isi gbaa ha ume? B
Foto nke B
Esa rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka imeri ọtụtụ ndị agha. Ma, ọ gakwuuru mmadụ ibe ya ka o nyere ya aka imeri ndị agha ole na ole. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị banyere ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka n’ihe niile anyị na-eme? (Ilu 3:5, 6)
Olee ụzọ ndị i nwere ike isi nwee ụdị obi ike Esa nwere?
Chebara Ihe Jehova Bu n’Obi Ime Echiche
Gịnị ka akụkọ a na-akụziri m gbasara Jehova?
Olee otú akụkọ a si gbasa ihe dị iche iche Jehova bu n’obi ime?
Gịnị ka m ga-achọ ịjụ Esa ma a kpọlite ya n’ọnwụ?
Mụtakwuo Ihe Ndị Ọzọ
Ọ bụrụ na i bi n’obodo i nweere onwe gị ife Jehova, olee otú ị ga-esi jiri oge a na-eme ihe bara uru otú Esa mere?
Chọpụta otú ihe Esa mere ga-esi enyere anyị aka inwe obi ike ma merie ihe ọ bụla chọrọ ime ka anyị mebie iwu Jehova.