53 PỌL
“Obi Sie Unu Ike”
JIZỌS ji aka ya mee ka Sọl onye Tasọs mata “ahụhụ niile ọ ga-ata” mgbe ọ ga-ekwusawa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ ihe. Ihe a Jizọs kwuru ò mezuru? Sọl, onye e jizi Pọl onyeozi mara, dere akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara Ndị Kọrịnt ihe dị ka afọ iri abụọ ọ ghọchara onye na-eso ụzọ Jizọs. N’ime oge ahụ, ‘e tiela ya ihe ọtụtụ ugboro, ọ nọọkwala n’ọnụ ọnwụ ọtụtụ ugboro.’ E nweekwala ugboro atọ ụgbọ mmiri ọ nọ na ya kpuru. N’otu n’ime ugboro atọ ahụ, o jidere ihe aka see n’elu mmiri otu ụbọchị, ehihie na abalị. Ma, a ka ga-enwe mgbe ọzọ ụgbọ mmiri ọ nọ na ya ga-ekpu.
Ma ka ọ dị ugbu a, Pọl anọọla ihe karịrị afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ ndị Rom dị na Sizaria. Gọvanọ na-achị Sizaria ekweghị ahapụ ya ka ọ lawa maka na ọ na-eche ka Pọl nye ya aka azụ. Ma mgbe gọvanọ ọzọ nọchiri ya, Pọl kwuziri na ya chọrọ ka Siza kpee ikpe ya. N’ikpeazụ, e tinyere Pọl n’ụgbọ mmiri na-aga Rom, bụ́ ebe Siza nọ. Otú ahụ ka Pọl si malite njem tara akpụ nke karịrị puku kilomita atọ. Luk, onye Pọl kpọrọ “onye anyị hụrụ n’anya, onye na-agwọ ọrịa,” onye sokwa ya na-ekwusa ozi ọma, so ya nọrọ n’ụgbọ mmiri ahụ. Onye ọzọ so ya bụ Onye Kraịst ibe ya aha ya bụ Arịstakọs.—Kọl. 4:14.
Mgbe ha ruru Maịra, nke dị n’Eshia Maịnọ, onye agha Rom aha ya bụ Juliọs, onye na-ahụ maka ndị mkpọrọ niile e du na-aga Rom, chọtara ụgbọ mmiri ndị Ijipt bú ibu na-aga Ịtali. Ya na ndị niile ahụ na-aga Rom banyeziri n’ụgbọ ahụ gawa. Ma, ifufe ekweghị ka njem ha gbapụ ọsọ. Ha jisiri ike ruo n’ebe a na-akpọ Ọdụ Ụgbọ Mmiri Ọma mgbe ha mechara ihe niile ha nwere ike ime. N’ebe ahụ, Pọl chọpụtara na ha ga-abanye ná nnukwu nsogbu ma ọ bụrụ na ha anọghị n’ebe ahụ ka oge oyi gafee.
Pọl onyeozi jizi obi ike kwuo okwu. Ọ gwara Juliọs na ‘ụgbọ ha ga-ekpu, ihe niile ha ji alaakwa n’iyi’ ma ọ bụrụ na ha akwọrọ ụgbọ ha na-aga. Ma, Juliọs egeghị Pọl ntị, kama o gere ndị ọzọ ntị, ha akwọrọ ụgbọ ha na-aga. O doro anya na o mechara kwaa ụta maka ihe a o kpebiri. Luk dere, sị: “Oké ifufe . . . malitere ife. Ifufe ahụ busiwere ụgbọ mmiri ahụ ike.” Obere oge, ifufe ahụ karịziri akarị. Kwa awa, kwa ụbọchị, ‘oké ifufe ahụ nọ na-aṅagharịsi ụgbọ ha ike.’ Iji mee ka ụgbọ mmiri ahụ ghara imi, ndị na-akwọ ya buuru ihe ndị e ji arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ tụba n’ime oké osimiri. O nweghị onye riri ihe ruo ọtụtụ ụbọchị. Luk kwuru na mgbe ọ fọrọ obere ka izu abụọ gafee, ha “kwụsịrị inwe olileanya na a ga-azọpụta” ha.
Mgbe Pọl na ndị mkpọrọ ndị ọzọ nọ n’ụgbọ mmiri ebili mmiri na-ebugharị, o nyere aka zọọ ndị niile nọ n’ụgbọ ahụ ndụ
Agwọ nọzi n’akịrịka. Ma Pọl ji obi ike gwa ndị nọ n’ụgbọ ahụ, sị: “Obi sie unu ike.” N’ihi ihe mmụọ ozi gwara ya n’abalị, ọ sịrị ha: “O nweghị onye ọ bụla n’ime unu ga-ala n’iyi, naanị ụgbọ a ga-ala n’iyi.” Mgbe ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ chọrọ iji ụgbọ epeepe dị n’ụgbọ mmiri ahụ gbafuo, Pọl gwara ha na ọtụtụ ndị ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha esi n’ụgbọ ahụ pụọ. E gbubiziri ụdọ ji ụgbọ epeepe ahụ tupu onye ọ bụla abanye na ya.
Tupu chi abọọ, mgbe ọchịchịrị ka gbara, Pọl gwara ndị niile nọ n’ụgbọ ahụ na ha nweziri ike iri ihe oriri otú ha chọrọ. Ọ gwara ha, sị: “O nweghị onye n’ime unu otu ntutu isi ya ga-ala n’iyi.” O keleziri Jehova n’ihu ha niile. Ha riri nri ma tụba ọka wit ndị fọrọnụ n’ime osimiri. Ihe Pọl katara obi gwa ha gbara ha ume. Luk dere, sị: “Ihe a o mere mesiri ha obi ike.” Mgbe anwụ wara, ụgbọ mmiri ahụ kụrụ n’elu otu mkputamkpu ájá, tọzie n’ebe ahụ, ebili mmiri amalitekwa ịkụrisị azụ ya. Ma, ihe Pọl kwuru mezuru. ‘Mmadụ niile pụtara n’elu ala n’enweghị ihe mere ha.’ E nweghị onye ọkọ kọrọ n’ime ha niile.
Ọ dabara na ọ bụ n’agwaetiti Mọlta ka ha nọ. Ọ dịghị anya, Pọl na ndị ya na ha so malitere ikwusa ozi ọma. Chineke jidị Pọl rụọ ọrụ ebube dị iche iche n’ebe ahụ. Obi tọrọ ọtụtụ ndị bi na Mọlta ụtọ, ha enye Pọl na ndị ya na ha so ọtụtụ onyinye.
Pọl akwụsịghị inwe obi ike. Mgbe o mechara ruo Rom mgbe ọnwa ole na ole gachara, a tụrụ ya mkpọrọ n’ebe ahụ ruo ihe dị ka afọ abụọ, e nwekwara onye nche nọ na-eche ya nche. Ma, ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma, sikwa n’ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ ozi dị iche iche. Mgbe a tọhapụrụ ya, ọ malitekwara ịgagharị na-ekwusa ozi ọma. Ma ka oge na-aga, a tụrụ ya mkpọrọ ọzọ na Rom. Nke a bụ nke ikpeazụ a ga-atụ ya mkpọrọ. Ọ ga-abụ na ndị Rom mechara gbuo nwoke a nwere obi ike nke ji obi ya niile na-efe Jehova. Ma, Pọl atụghị ụjọ ọnwụ. Ọ kpọrọ ọnwụ “onye iro ikpeazụ,” ọ makwa na Jehova Chineke ga-emeri ya. (1 Kọr. 15:26) Mgbe oge ruru, Pọl ga-enweta ụgwọ ọrụ e kwere ya ná nkwa, ya bụ, ịdị ndụ n’eluigwe bụ́ ebe ọ na-agaghị anwụ anwụ, ma soro Jizọs Kraịst bụrụ eze na onye nchụàjà.
Gụọ akụkọ a na Baịbụl:
Ajụjụ a ga-aza:
Gịnị na gịnị ka Pọl mere gosiri na o nwere obi ike n’oge a ná ndụ ya?
Mụtakwuo Ihe
1. Ọ̀ ga-abụ gịnị mere Sọl ji chọọ ka a na-akpọ ya aha Rom ya bụ́ Pọl kama ịkpọ ya Sọl? (w08 3/1 12 ¶4-5)
2. Afọ itoolu gafere n’agbata afọ Pọl lara Tasọs na mgbe ọ gawara Antiọk. A kpọrọ afọ itoolu ahụ “afọ ndị a na-amaghị ihe banyere” Pọl. Olee ụdị nsogbu ndị ọ ga-abụ na o nwere n’oge ahụ? (w00 7/15 26-27, igbe ¶3-4)
3. Ọ̀ dị mma na Pọl tụụrụ Juliọs aro ka ụgbọ mmiri ha cheretụ kama ịgawa Ịtali ozugbo ahụ? (Ọrụ 27:9, 10; wp17.5 9 ¶3-4) A
Foto nke A: Ụgbọ mmiri e ji ebu ibu a rụrụ n’oge ndịozi Jizọs. O yiri nke Pọl banyere na Maịra
4. Gịnị mere ndị bi na Mọlta ji kwuo banyere Pọl, sị: “Nwoke a bụ ogbu mmadụ”? (Ọrụ 28:4; w15 10/1 9 ¶5-6)
Chebara Ihe Ndị Ị Mụtara Echiche
Pọl gwara ndị ya na ha nọ n’ụgbọ mmiri na Chineke ga-eme ka a ghara ‘inwe onye ọ bụla n’ime ha ga-ala n’iyi, naanị ụgbọ ha ga-ala n’iyi.’ (Ọrụ 27:22, 34) Gịnị ka ihe a na-akụziri gị gbasara ihe Jehova ga-emeli, oleekwa otú o si gbasa otú i si ele ọrụ ikwusa ozi ọma anya?
Ekpere Pọl kpere ‘mesiri ndị ya na ha nọ n’ụgbọ obi ike.’ (Ọrụ 27:35, 36) Olee oge ndị ekpere anyị na-ekpe nwere ike ịgba ndị ọzọ ume? B
Foto nke B
Olee otú i nwere ike isi nwee ụdị obi ike Pọl nwere n’akụkọ a?
Chebara Ihe Jehova Bu n’Obi Ime Echiche
Gịnị ka akụkọ a na-akụziri m gbasara Jehova?
Olee otú akụkọ a si gbasa ihe dị iche iche Jehova bu n’obi ime?
Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ a gbasara Pọl nke mere obi ji dị gị ụtọ na o so ná ndị a họọrọ iso Kraịst chịa n’eluigwe?
Mụtakwuo Ihe Ndị Ọzọ
Chọpụta otú iji ụgbọ mmiri eme njem si baa uru n’oge ndịozi nakwa otú e si jiri ya kwusaa ozi ọma.
Olee otú ụfọdụ ndị okenye sirila tachie obi ma nyere ụmụnna ha aka ka Pọl?