Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 106
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mụ na Onye Nkụzi M Dịrị ná Mma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mụ na Onye Nkụzi M Dịrị ná Mma?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị nkụzi obi ọjọọ
  • Ihe ndị i nwere ike ime
  • Otú gị na onye nkụzi gị nwere ike isi kwurịta okwu
  • Olee Otú Mụ na Onye Nkụzi Anyị Ga-esi Na-adị ná Mma?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Ndị Nkụzi—Gịnị Mere Ha Ji Dị Anyị Mkpa?
    Teta!—2002
  • Ọ Rụzuru Ihe Karịrị Ihe Ọ Tụrụ Anya Ya
    Teta!—2003
  • Gịnị Mere E Ji Abụ Onye Nkụzi?
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 106
Ebe otu onye nkụzi na-agbazi otu nwa agbọghọ na-eto eto n’ihu ụmụ klas ya.

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mụ na Onye Nkụzi M Dịrị ná Mma?

  • Ndị nkụzi obi ọjọọ

  • Ihe ndị i nwere ike ime

  • Otú gị na onye nkụzi gị nwere ike isi kwurịta okwu

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Ndị nkụzi obi ọjọọ

Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ụmụ akwụkwọ niile nwere onye nkụzi ha chere na ọ na-emesi ha ike, na ọ na-anaghị ekwe ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko, ma ọ bụ na ọ dị obi ọjọọ.

  • Luis, nwa okorobịa dị afọ 21 kwuru, sị: “N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nwere otu onye nkụzi na-agwakarị ụmụ akwụkwọ okwu ọjọọ, ọ naghịkwa akwanyere ha ùgwù. O nwere ike ịbụ na o chere na a gaghị achụ ya n’ọrụ ebe ọ bụ na ọ fọrọ obere ka ọ laa ezumike nká.”

  • Melanie, nwa agbọghọ dị afọ 25, ka na-echeta otú onye nkụzi ha si emeso ya ihe otú dị iche n’otu o si emeso ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ. Melanie kwuru, sị: “Onye nkụzi anyị ahụ kwuru na ihe mere na ya anaghị ekwe m ṅụrụ mmiri tọgbọ iko bụ na anaghị m aga chọọchị ọtụtụ ndị na-aga. O kwukwara na otú ahụ o si emeso m ga-eme ka imesi m ike ghara ịbụrụ m nsogbu mgbe m ga-eto n’ihi na ọ marala m ahụ́.”

Ọ bụrụ na ihe anaghị adabara gị na onye nkụzi unu, o nwere ihe ndị ị ga-eme ka obi ghara ịna-ajọ gị njọ oge niile ị na-agụ akwụkwọ. Lee ihe ndị i nwere ike ime.

Ihe ndị i nwere ike ime

  • Dịrị njikere ịna-eme ihe onye nkụzi gị nke ọ bụla chọrọ. Ihe otu onye nkụzi na-achọ ka ụmụ akwụkwọ ya na-eme na-adị iche n’ihe onye nkụzi ọzọ na-achọ ka ha na-eme. Gbaa mbọ chọpụta ihe onye nkụzi ọ bụla chọrọ ka ị na-eme, gbalịakwa na-eme ya.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ma ihe na-ege ntị ka ọ mụtakwuo ihe.”​—Ilu 1:5.

    “M chọpụtara na m kwesịrị ịna-eme ihe otú na-amasị onye nkụzi m, n’ihi ya, m na-eme ike m niile ime ihe ndị o kwuru ka e mee, otú ọ chọrọ ka e si mee ha. Ihe a mere ka ihe na-adabara mụ na ya.”​—Christopher

  • Na-akwanyere ndị nkụzi gị ùgwù. Gbalịa jiri olu ọma na-agwa ndị nkụzi gị okwu. Ọ bụrụgodị na ha agwa gị okwu otú na-adịghị mma, asakwala ha okwu. Cheta na ha na-ele gị anya na ị bụ nwa akwụkwọ ha, ọ bụghị ọgbọ ha.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Ka okwu unu na-atọ ụtọ mgbe niile ka ihe e tinyere nnu. Ọ ga-eme ka unu mara otú unu ga-esi azaghachi onye ọ bụla.”​—Ndị Kọlọsi 4:6.

    “Ị gbaa mbọ na-akwanyere ndị nkụzi unu ùgwù, ha ga na-emeso gị otú dị mma n’ihi na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ anaghị akwanyere ha ùgwù.”​—Ciara

  • Na-aghọta ndị nkụzi gị. Ndị nkụzi bụkwa mmadụ otú ahụ ụmụ akwụkwọ bụ. N’ihi ya, otú ahụ ndị ọzọ nwere ọtụtụ ihe ha na-eme na ihe ndị na-echegbu ha ka hanwa nwekwara. N’ihi ya, ekwula ngwa ngwa na onye nkụzi gị dị obi ọjọọ ma ọ bụ na ọ kpọrọ gị asị.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Anyị niile na-emejọ ihe.”​—Jems 3:2.

    “Ọrụ nkụzi adịghị mfe. Ịchịkọta ọtụtụ ụmụaka ka ha nọrọ jii ka e nwee ike kụziere ha ihe abụghị obere ọrụ. N’ihi ya, m na-agwa onwe m na m na-akpa ezigbo àgwà, ọ ga-ebelatara onye nkụzi anyị ọrụ o nwere.”​—Alexis

  • Gwa papa gị na mama gị gbasara ya. Ndị kacha achọ ka ihe gaziere gị bụ nne na nna gị. Ha chọrọ ka ị na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ha nwekwara ike ịgwa gị ihe ị ga-eme ka ihe na-adabara gị na ndị nkụzi ọ na-esi ike imete mma.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu.”​—Ilu 15:22.

    “Idozi nsogbu dị iche iche doro ndị nne na nna anya karịa ndị na-eto eto. N’ihi ya, nabata ndụmọdụ ha. O nwere ike inyere gị aka imeri nsogbu ndị ị na-enwe.”​—Olivia

Otú gị na onye nkụzi gị nwere ike isi kwurịta okwu

Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka ị gakwuru onye nkụzi unu ka gị na ya kwurịta nsogbu ahụ unu na-enwe. Echegbula onwe gị ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị na olu unu ga-alawa elu. Cheta na ihe ị na-aga abụghị ka unu rụwa ụka, kama ọ bụ ka unu kwurịta okwu. O nwere ike iju gị anya na ọ bụ otú dị mfe isi edozi okwu unu.

Ihe Baịbụl kwuru: “Ka anyị na-eme ihe ọ bụla anyị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo.”​—Ndị Rom 14:19.

“Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ọ bụ naanị gị ka onye nkụzi ahụ na-akpaso àgwà na-adịghị mma, jụọ ya ma ò nwere ihe i mere ya na-ewe ya iwe. Ihe ọ zara gị ga-enyere gị aka ịma ebe ị ga-emezikwu.”​—Juliana

“O nwere ike ịkacha mma ka i meda obi gwa onye nkụzi unu otú obi dị gị mgbe naanị gị na ya nọ, i nwere ike ime ya tupu akwụkwọ amalite ma ọ bụ mgbe a gbasara. O nwere ike ichebara okwu ahụ echiche ma nwee obi ụtọ maka otú i si bịakwute ya ka unu kwurịta nsogbu ahụ.”​—Benjamin

IHE MERE EME

“O nwere oge m na-anaghị eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, onye nkụzi anyị enyekwaraghị m aka ọ bụla. M chọdịrị ịkwụsị ịga akwụkwọ n’ihi na otú o si na-emeso m ihe mere ka ike ịga akwụkwọ gwụ m.

“M gakwuuru onye nkụzi ọzọ ma kọọrọ ya nsogbu a ka ọ tụọrọ m aro ihe m ga-eme. Ọ gwara m, sị: ‘Ọ machaghị gị nke ọma, gịnwa amachaghịkwa ya. I kwesịrị ịga gwa ya ihe bụ́ nsogbu gị. O nwedịrị ike ime ka ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ ụjọ na-atụ ịga ka ha na ya kwurịta okwu kwụsị ịtụ ụjọ.’

“Achọbughị m ime ihe ahụ ọ gwara m. Ma, mgbe m chebaara ya echiche, m hụrụ na ọ bụ ihe m kwesịrị ime. Ọ bụrụ na m chọrọ ka ihe gbanwee, m kwesịrị ibute ụzọ n’ihe ọ bụla a ga-eme ka ọ gbanwee.

“N’echi ya, m gakwuuru onye nkụzi ahụ wetuo obi gwa ya na otú o si akụzi ihe na-amasị m nakwa na m chọrọ ịna-aghọta ihe ọ na-akụzi nke ọma. Mana na amaghị m ihe m ga-eme n’ihi na ịghọta ya na-esiri m ike. Ọ gwara m ihe ụfọdụ m nwere ike ime, wepụtakwa oge ya ịna-enyere m aka ma a gbasaa akwụkwọ ma ọ bụ ịna-ezitere m ihe ndị ga-enyere m aka n’ozi iimel.

“Ihe a juru m ezigbo anya. Mkparịta ụka ahụ mere ka mụ na onye nkụzi ahụ dịrị ná mma, ịga akwụkwọ atọwakwa m ụtọ.”​—Maria

Ebe Maria na onye nkụzi ya na-ekwurịta okwu mgbe a gbasara akwụkwọ.

Ihe i nwere ike ime: Ọ bụrụ na e nwere onye nkụzi ihe na-anaghị adabachara gị na ya, were ya na ị ga-esi na ya mụta ihe ga-enyere gị aka ma i too. Katie bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 22 kwuru, sị: “Ọ bụrụgodị na ị gụchaa akwụkwọ, a ka ga-enwe ndị gị na ha ga-emekọ ihe ọkwá ha gbagotere, ndị ihe na-agaghị adabachara gị na ha. Ọ bụrụ na i mere ka ihe dabawara gị na onye nkụzi ihe na-anaghị adababuru gị na ya, ị ga-amali otú ị ga-esi mee ka ihe dabawara gị na onye ọ bụla ọzọ n’ọdịnihu.”

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Jayza.

“E nwere ụfọdụ oge onye nkụzi anyị na-akpasu m iwe. Ma mama m na-enyere m aka iche ihe o nwere ike ịbụ ya mere onye nkụzi ahụ ji mee ihe o mere. Ihe a na-enyere m aka ịhụ na ekwesịghị m ịna-atụ anya ka ndị nkụzi m mee ihe ha na-agaghị emeli.”​—Jayza.

Victor.

“Anyị nwere ike ịna-akwanyere mmadụ ùgwù maka ọrụ ọ na-arụ ọ bụrụgodị na ihe ya anaghị amasị anyị. Ndị nkụzi so ná ndị e kwesịrị ịna-akwanyere ùgwù. N’ihi ya, ọ bụrụgodị na onye nkụzi dị obi ọjọọ, ịkwanyere ya ùgwù ga-abara gị ezigbo uru. O nwedịrị ike ime ka onye nkụzi ahụ chebara onwe ya echiche.”​—Victor.

Julia.

“Otú ị ga-esi egosi na ị dị umela n’obi ma na-akwanyere onye nkụzi unu ùgwù bụ ịdị obiọma ma na-akpaso ya àgwà ọma, ọ bụrụgodị na yanwa adịghị obiọma ma ọ bụ na-akpaso gị àgwà ọma. Ime otú ahụ nwere ike ime ka o bido ịkwanyekwuru gị ùgwù, gbanwetụkwa otú o si akpaso gị àgwà.”​—Julia.

Nchịkọta: Gịnị ka m ga-eme ka mụ na onye nkụzi m dịrị ná mma?

  • Dịrị njikere ịna-eme ihe onye nkụzi gị nke ọ bụla chọrọ. Gbaa mbọ chọpụta ihe onye nkụzi ọ bụla chọrọ ka ị na-eme, gbalịakwa na-eme ya.

  • Na-akwanyere ndị nkụzi gị ùgwù. Cheta na ị bụ nwa akwụkwọ, n’ihi ya, agwala ndị nkụzi gị okwu ọjọọ, asakwala ha okwu.

  • Na-aghọta ndị nkụzi gị. Ọrụ ndị nkụzi abụghị obere ọrụ. Na-enwere ha ndidi.

  • Gwa papa gị na mama gị gbasara ya. Ha ma ọtụtụ ihe gbasara otú e si emeso ụdị mmadụ dị iche iche ihe.

  • Gị na onye nkụzi gị kwurịta okwu. Gakwuru onye nkụzi gị ma wetuo obi gwa ya ka o nyere gị aka, abakwarala ya mba. Mee ka o doo ya anya na ị chọrọ ka ihe na-adabara gị na ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2027)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya