18 Ana m adụ unu ọdụ ka unu bịa ka m resị unu ọlaedo e ji ọkụ nụchaa, ka unu wee baa ọgaranya. Ka m resịkwa unu uwe na-acha ọcha, ka unu wee yiri uwe, ma ọ́ bụghị ya, ndị ọzọ ga-ahụ ọtọ unu, ihere emee unu.+ Ka m resịkwa unu ọgwụ anya unu ga-ete n’anya unu+ ka unu hụwa ụzọ.+