-
Izi Ihe Chineke Megide Ozizi Ndị Mmụọ ỌjọọỤlọ Nche—1994 | Eprel 1
-
-
6. Olee otú Setan si maa ịdịmma na ọkaaka Jehova aka?
6 Ma Setan kwuru karịa nke ahụ. Ọ gara n’ihu, sị: “N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” Dị ka Setan kwuru, Jehova Chineke—onye nyeworo nne na nna anyị mbụ ihe n’ụba—chọrọ ịnapụ ha ihe dị ebube. Ọ chọrọ igbochi ha ịdị ka ndị bụ chi. Otú a, Setan mara ịdịmma Chineke aka. Ọ kwalitekwara mmụọ imeju agụụ onwe onye na ịma ụma lefuru iwu Chineke anya, na-asị na ime ihe n’ụzọ dị otú a ga-eweta abamuru. Ya bụ na Setan mara ịchịisi Chineke n’ebe ihe O kere n’onwe ya nọ aka, na-ekwu na Chineke enweghị ikike ịkpa ókè n’ihe mmadụ na-eme.
7. Olè mgbe mbụ a nụrụ ozizi ndị mmụọ ọjọọ, oleekwa otú ha si nwee myirịta taa?
7 Site n’okwu ndị ahụ nke Setan, a malitere ịnụ ozizi ndị mmụọ ọjọọ. Ajọ ozizi ndị a ka nọgidere na-akwalite ụkpụrụ asọpụrụghị Chineke ndị yiri ya. Dị nnọọ ka o mere n’ogige Iden, Setan, onye ndị mmụọ ndị ọzọ nupụrụ isi sonyeere ugbu a, ka nọgidere na-ama ikike Chineke nwere iguzobe ụkpụrụ ndị a ga-eji mee ihe aka. Ọ ka na-emegide ịchịisi Jehova ma na-agbalị ịrụgide ndị mmadụ ka ha nupụrụ Nna ha nke eluigwe isi.—1 Jọn 3:8, 10.
-
-
Izi Ihe Chineke Megide Ozizi Ndị Mmụọ ỌjọọỤlọ Nche—1994 | Eprel 1
-
-
13. Ụgha ndị dị aṅaa ka Setan gwaworo ihe a kpọrọ mmadụ eri Iden?
13 Nye Iv, Setan boro Jehova ebubo ịgha ụgha ma sị na ụmụ mmadụ pụrụ ịdị ka chi ma ọ bụrụ na ha enupụrụ Onye Okike ha isi. Ọnọdụ mmehie ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya taa na-anwapụta na Setan, ọ bụghị Jehova, bụ onye ghara ụgha. Ụmụ mmadụ taa abụghị chi! Otú ọ dị, Setan ji ụgha ndị ọzọ sochie ụgha mbụ ahụ. O webatara echiche nke na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ. O si otú a chee n’ihu ihe a kpọrọ mmadụ ohere nke ịdị ka chi n’ụzọ ọzọ. Mgbe ahụ, na-adabere n’ozizi ụgha ahụ, ọ kwalitere nkụzi ọkụ ala mmụọ, pọgatrị, mgbaasị, na ife ndị nna ochie ofufe. Ụgha ndị a ka na-ejigide ọtụtụ nde mmadụ n’agbụ.—Deuterọnọmi 18:9-13.
-
-
Izi Ihe Chineke Megide Ozizi Ndị Mmụọ ỌjọọỤlọ Nche—1994 | Eprel 1
-
-
16. Olee ihe ndị na-adịte anya a rụpụtara mgbe ụmụ mmadụ na-agbaso amamihe nke aka ha?
16 Site n’ụgha ndị ọ ghara n’ogige Iden, Setan gbara Adam na Iv ume inwe ọchịchọ nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ na ịdabere n’amamihe onwe ha. Taa, anyị na-ahụ ihe ndị ọ rụpụtara bụ́ ndị na-adịte anya ná mpụ, ihe isi ike akụ̀ na ụba, agha, na ajọ ahaghị nhata dị n’ụwa taa. Ka a sịkwa ihe mere Bible ji sị: “Amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ”! (1 Ndị Kọrint 3:19) Ka o sina dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-eji nzuzu họrọ ịta ahụhụ kama ige izi ihe Jehova ntị. (Abụ Ọma 14:1-3; 107:17) Ndị Kraịst, ndị nabataworo izi ihe Chineke, na-ezere ịdaba n’ọnyà ahụ.
-