Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Izi Ihe Chineke Megide Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Ụlọ Nche—1994 | Eprel 1
    • 6. Olee otú Setan si maa ịdịmma na ọkaaka Jehova aka?

      6 Ma Setan kwuru karịa nke ahụ. Ọ gara n’ihu, sị: “N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” Dị ka Setan kwuru, Jehova Chineke​—⁠onye nyeworo nne na nna anyị mbụ ihe n’ụba⁠—​chọrọ ịnapụ ha ihe dị ebube. Ọ chọrọ igbochi ha ịdị ka ndị bụ chi. Otú a, Setan mara ịdịmma Chineke aka. Ọ kwalitekwara mmụọ imeju agụụ onwe onye na ịma ụma lefuru iwu Chineke anya, na-asị na ime ihe n’ụzọ dị otú a ga-eweta abamuru. Ya bụ na Setan mara ịchịisi Chineke n’ebe ihe O kere n’onwe ya nọ aka, na-ekwu na Chineke enweghị ikike ịkpa ókè n’ihe mmadụ na-eme.

      7. Olè mgbe mbụ a nụrụ ozizi ndị mmụọ ọjọọ, oleekwa otú ha si nwee myirịta taa?

      7 Site n’okwu ndị ahụ nke Setan, a malitere ịnụ ozizi ndị mmụọ ọjọọ. Ajọ ozizi ndị a ka nọgidere na-akwalite ụkpụrụ asọpụrụghị Chineke ndị yiri ya. Dị nnọọ ka o mere n’ogige Iden, Setan, onye ndị mmụọ ndị ọzọ nupụrụ isi sonyeere ugbu a, ka nọgidere na-ama ikike Chineke nwere iguzobe ụkpụrụ ndị a ga-eji mee ihe aka. Ọ ka na-emegide ịchịisi Jehova ma na-agbalị ịrụgide ndị mmadụ ka ha nupụrụ Nna ha nke eluigwe isi.​—⁠1 Jọn 3:​8, 10.

  • Izi Ihe Chineke Megide Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Ụlọ Nche—1994 | Eprel 1
    • 13. Ụgha ndị dị aṅaa ka Setan gwaworo ihe a kpọrọ mmadụ eri Iden?

      13 Nye Iv, Setan boro Jehova ebubo ịgha ụgha ma sị na ụmụ mmadụ pụrụ ịdị ka chi ma ọ bụrụ na ha enupụrụ Onye Okike ha isi. Ọnọdụ mmehie ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya taa na-anwapụta na Setan, ọ bụghị Jehova, bụ onye ghara ụgha. Ụmụ mmadụ taa abụghị chi! Otú ọ dị, Setan ji ụgha ndị ọzọ sochie ụgha mbụ ahụ. O webatara echiche nke na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ. O si otú a chee n’ihu ihe a kpọrọ mmadụ ohere nke ịdị ka chi n’ụzọ ọzọ. Mgbe ahụ, na-adabere n’ozizi ụgha ahụ, ọ kwalitere nkụzi ọkụ ala mmụọ, pọgatrị, mgbaasị, na ife ndị nna ochie ofufe. Ụgha ndị a ka na-ejigide ọtụtụ nde mmadụ n’agbụ.​—⁠Deuterọnọmi 18:​9-⁠13.

  • Izi Ihe Chineke Megide Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Ụlọ Nche—1994 | Eprel 1
    • 16. Olee ihe ndị na-adịte anya a rụpụtara mgbe ụmụ mmadụ na-agbaso amamihe nke aka ha?

      16 Site n’ụgha ndị ọ ghara n’ogige Iden, Setan gbara Adam na Iv ume inwe ọchịchọ nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ na ịdabere n’amamihe onwe ha. Taa, anyị na-ahụ ihe ndị ọ rụpụtara bụ́ ndị na-adịte anya ná mpụ, ihe isi ike akụ̀ na ụba, agha, na ajọ ahaghị nhata dị n’ụwa taa. Ka a sịkwa ihe mere Bible ji sị: “Amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ”! (1 Ndị Kọrint 3:19) Ka o sina dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-eji nzuzu họrọ ịta ahụhụ kama ige izi ihe Jehova ntị. (Abụ Ọma 14:1-⁠3; 107:17) Ndị Kraịst, ndị nabataworo izi ihe Chineke, na-ezere ịdaba n’ọnyà ahụ.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya