Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Irite Uru Site n’Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Jehova
    Ụlọ Nche—2002 | Mee 15
    • Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Chineke Na-eweta Nnwere Onwe na Nchebe

      11, 12. (a) N’oge ọnwụnwa dị aṅaa ka obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova ruru Josef ahụ́? (b) Olee otú Chineke si gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ya n’ebe Josef nọ?

      11 Ọzọ, ka anyị tụlee Jenesis isi 39. O hiwere isi n’ebe nwa nwa nwa Ebreham bụ́ Josef nọ, bụ́ onye e renyere n’ịbụ ohu n’Ijipt. Otú o sina dị, ‘Jehova nọnyeere Josef.’ (Amaokwu nke 1, 2) N’ezie, ọbụna onye nwe Josef n’Ijipt bụ́ Pọtịfa, kwubiri na Jehova nọnyeere Josef. (Amaokwu nke 3) Otú ọ dị, Josef chere ule siri ike ihu. E boro ya ebubo ụgha na ọ nwara iso nwunye Pọtịfa nwee mmekọahụ n’ike, a tụkwara ya mkpọrọ. (Amaokwu nke 7-20) Ọ bụ “n’olulu” ụlọ mkpọrọ ka ha “weere agbụ kesie ụkwụ ya abụọ ike; mkpụrụ obi ya bara n’ígwè.”—Jenesis 40:15; Abụ Ọma 105:18.

      12 Gịnị mere n’oge ahụ o nwere ahụmahụ ahụ tara nnọọ akpụ? “Jehova nọnyeere Josef, mee ka ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] Ya ruo ya ahụ́.” (Amaokwu 21a) Kpọmkwem otu obiọma sitere n’ịhụnanya e gosiri malitere usoro ihe ndị mesịrị mee ka Josef nwere onwe ya pụọ ná nsogbu ndị ọ nọ na-enwe. Jehova nyere Josef “amara n’ihu onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ.” (Amaokwu nke 21b) N’ihi ya, onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ nyere Josef ọrụ dị ùgwù. (Amaokwu nke 22) Mgbe nke ahụ gasịrị, Josef zutere nwoke nke mesịrị mee ka Fero, bụ́ onye na-achị Ijipt, nụ banyere ya. (Jenesis 40:1-4, 9-15; 41:9-14) N’aka nke ya, eze ahụ buliri Josef gaa n’ọkwá ịbụ onye nke abụọ n’Ijipt, na-eduga na ya ịrụ ọrụ zọpụtara ndụ n’ala Ijipt ahụ ụnwụ nri kpara aka ọjọọ. (Jenesis 41:37-55) Nhụjuanya Josef malitere mgbe ọ dị afọ 17 ma dịgide ruo ihe karịrị afọ 12! (Jenesis 37:2, 4; 41:46) Ma n’ime afọ ndị ahụ nile ọ tara ahụhụ ma hụjuo anya, Jehova Chineke gosipụtara obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe Josef nọ site n’ichebe ya pụọ n’ọdachi gaara egbu ya na site n’ichebe ya maka ikere òkè dị ùgwù ná nzube Ya.

  • Irite Uru Site n’Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Jehova
    Ụlọ Nche—2002 | Mee 15
    • 16. Olee okwu ọma Bible kwuru banyere Ebreham na Josef?

      16 Ihe ndekọ ahụ dị na Jenesis isi 24 mere ka nkekọ dị n’etiti Ebreham na Jehova doo nnọọ anya. Amaokwu nke mbụ na-ekwu na “Jehova gọzikwararịị Abraham n’ihe nile.” Ohu Ebreham kpọrọ Jehova “Chineke nke onye nwe m Abraham.” (Amaokwu nke 12, 27) Jems onye na-eso ụzọ na-ekwukwa na ‘a kpọrọ Ebreham onye ezi omume,’ e wee “na-akpọ ya ‘enyi Jehova.’” (Jems 2:21-23) Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe Josef nọ. E mesiri mmekọrịta chiri anya dị n’etiti Jehova na Josef ike n’ebe nile na Jenesis isi nke 39. (Amaokwu nke 2, 3, 21, 23) Ọzọkwa, banyere Josef, Stifen onye na-eso ụzọ kwuru, sị: “Chineke nọnyeere ya.”—Ọrụ 7:9.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya