-
Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọpụta Aha Chineke?Teta!—1999 | Mach 8
-
-
ERI ọtụtụ narị afọ okpukpe ndị Juu akụziwo na aha Chineke, bụ́ Jehova, dịbigara nsọ ókè nke na e kwesịghị ịkpọpụta ya.a (Abụ Ọma 83:18) Ọtụtụ ndị ọkà mmụta okpukpe echewo na ọ bụ enweghị nkwanye ùgwù bụ́ ịkpọ Onye Okike dị ebube aha a ma ama otú ahụ ma ọ bụ ọbụna na ọ bụ ịda iwu nke atọ n’ime Iwu Iri ahụ, bụ́ nke machibidoro ‘iji aha Onyenwe anyị eme ihe efu.’ (Ọpụpụ 20:7, King James Version) Na narị afọ nke atọ O.A., Mishnah kwuru na “onye kpọpụtara Aha Chineke otú ahụ e si asụpe ya” ‘enweghị òkè n’ụwa nke na-abịanụ.’—Sanhedrin 10:1.
-
-
Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọpụta Aha Chineke?Teta!—1999 | Mach 8
-
-
Iwu nke Atọ
Ma gịnị banyere mmachibido iwu ahụ e kwuru okwu ya n’iwu nke atọ n’ime Iwu Iri ahụ? Ọpụpụ 20:7 na-ekwusi ike, sị: “Gị eburula aha Jehova, bụ́ Chineke gị, ime ihe efu; n’ihi na Jehova agaghị agụ onye na-eburu aha Ya ime ihe efu n’onye ikpe na-amaghị.”
Gịnị ka iji aha Chineke ‘eme ihe efu’ pụtara kpọmkwem? Akwụkwọ bụ́ The JPS Torah Commentary, nke Òtù Ndị Juu Na-ebipụta Akwụkwọ bipụtara, na-akọwa na okwu Hibru ahụ a sụgharịrị n’elu ịbụ “ime ihe efu” (lash·shaw’ʹ) pụrụ ịpụta “n’ụzọ ụgha” ma ọ bụ “ime ihe na-abụghị ihe.” Otu akwụkwọ ntụaka ahụ gara n’ihu, na-asị: “Mgbagwoju anya [nke okwu Hibru a] na-eme ka e gbochie ndị na-ese okwu ịṅụ iyi ụgha n’ụlọikpe, na iji Aha Chineke eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ eme ihe egwuregwu.”
Nkọwa a nke ndị Juu na-emesi ya ike n’ụzọ ziri ezi na ‘iji aha Chineke eme ihe efu’ na-agụnye iji aha ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ma à pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na ịkpọpụta aha Chineke mgbe a na-akụziri ndị ọzọ banyere ya ma ọ bụ mgbe a na-agakwuru Nna anyị nke eluigwe n’ekpere bụ ‘ihe na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ihe egwuregwu’? Jehova na-ekwupụta echiche ya n’okwu nke Abụ Ọma 91:14: “N’ihi na ọ hụwo m n’anya sie ike, m ga-emekwa ka ọ gbapụta: M ga-eme ka ọ nọọ n’ebe dị elu, n’ihi na ọ mawo aha m.”
-