Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Chineke Ya Kasiri Ya Obi
    Ṅomie Okwukwe Ha
    • 20, 21. (a) Kọwaa ihe Ịlaịja hụrụ mgbe ọ nọ n’ihu ọgba ahụ dị n’Ugwu Horeb. (b) Gịnị ka otú Jehova si gosi ike ya dị egwu kụziiri Ịlaịja?

      20 Olee ihe Jehova mere ka ụjọ kwụsị ịtụ Ịlaịja nakwa ka ahụ́ ruo ya ala? Mmụọ ozi ahụ gwara Ịlaịja ka o guzoro n’ọnụ ọgba ahụ. Ịlaịja mere ihe a gwara ya n’agbanyeghị na ọ maghị ihe na-aga ime. Oké ifufe maliteziri ife. Ọ ga-abụ na ifufe ahụ mere mkpọtụ dị egwu n’ihi na ọ gbawasịrị ugwu na nkume ndị dị ebe ahụ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ịlaịja ji otu aka kpuchie anya ya ma were aka nke ọzọ jide uwe ajị ajị o yi ka ifufe ahụ ghara iburu ya. Mgbe ifufe ahụ fechara, ala ọma jijiji malitere. Nke a mere ka Ịlaịja chọwa ihe ọ ga-eme ka ọ ghara ịda. Mgbe ala ọma jijiji ahụ mechara, nnukwu ọkụ malitere ịgba nke mere ka Ịlaịja banye n’ime ọgba ahụ ka ọkụ ahụ ghara imerụ ya ahụ́.—1 Eze 19:11, 12.

      Ebe Ịlaịja guzo n’ọnụ ọgba ma na-eze ka ọkụ ghara imerụ ya ahụ́

      Jehova ji ike ya na-enweghị atụ kasie Ịlaịja obi ma gbaa ya ume

      21 Baịbụl kwuru na Jehova anọghị ma n’oké ifufe ahụ ma n’ala ọma jijiji ahụ ma n’ọkụ ahụ. Ịlaịja ma na Jehova abụghị chi nkịtị ka Bel, bụ́ chi ndị na-efe ya na-akpọ “chi na-achị ígwé ojii,” ma ọ bụ chi na-eweta mmiri ozuzo. Ọ bụ Jehova mere ka ifufe na mmiri na ihe ndị ọzọ na-akpa ike dị egwu. Ma, yanwa dị ike karịa ihe ọ bụla o kere eke. Eluigwe enwedịghị ike ịba ya. (1 Eze 8:27) Olee otú ihe niile a merenụ si nyere Ịlaịja aka? Cheta na ụjọ ji ya. Ma, ebe ọ bụ na Jehova, bụ́ onye nwere ike dị egwu, kwụ ya n’azụ, o kwesịghị ịtụwa Ehab na Jezibel ụjọ.—Gụọ Abụ Ọma 118:6.

      22. (a) Olee otú “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ” si mee ka Ịlaịja mara na Jehova ka ji ya kpọrọ ihe? (b) Ònye ka o nwere ike ịbụ ya nwe ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ’? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

      22 Mgbe ọkụ ahụ nyụrụ, ebe niile adaakwa jụụ, Ịlaịja nụziri “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ.” Olu ahụ jụkwara Ịlaịja ajụjụ ahụ a jụrụ ya na mbụ. Nke a mere ka Ịlaịja kwuokwa otú obi dị ya ọzọ.a O nwere ike ịbụ na nke a mere ka ahụ́ rukwuo ya ala. Ma, o doro anya na ihe kadị gbaa Ịlaịja ume bụ ihe ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ’ gwaziri ya. Jehova mere ka o doo Ịlaịja anya na ya ka ji ya kpọrọ ihe. Olee otú o si mee nke a? Chineke gwara Ịlaịja ọtụtụ ihe ya ka ga-eme iji wepụ ofufe Bel n’Izrel. O doro anya na ọrụ Ịlaịja rụrụ abụghị n’efu n’ihi na ihe Chineke bu n’obi ime ga-emezurịrị. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova ka chọrọ ka Ịlaịja soro mezuo ihe ahụ Jehova bu n’obi ime. Ọ bụ ya mere o ji nyekwuo ya ọrụ, gwakwa ya otú ọ ga-esi rụọ ha.—1 Eze 19:12-17.

  • Chineke Ya Kasiri Ya Obi
    Ṅomie Okwukwe Ha
    • a O nwere ike ịbụ mmụọ ozi ahụ nke e kwuru ná 1 Ndị Eze 19:9 na “okwu Jehova” si n’ọnụ ya ruo Ịlaịja ntị, nwe ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ.’ N’amaokwu nke 15, a kpọrọ mmụọ ahụ “Jehova.” Nke a na-echetara anyị mmụọ ozi Jehova ji duo ndị Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa. Chineke kwuru banyere mmụọ ozi ahụ, sị: “Aha m dị n’ime ya.” (Ọpụ. 23:21) Anyị agaghị asị na ọ ga-abụrịrị Jizọs nwe olu ahụ. Ma, ọ dị mma icheta na ọ bụ Jizọs bụ “Okwu ahụ” tupu ya abịa n’ụwa. Nke a pụtara na ọ bụ ya bụ Ọnụ Na-ekwuchitere Chineke, onye Jehova si n’aka ya zie ndị na-efe ya ozi.—Jọn 1:1.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya