-
Ụmụ Anyị—ihe Nketa Dị Oké Ọnụ AhịaỤlọ Nche—2005 | Eprel 1
-
-
Ụmụ Anyị—ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa
“Lee, ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ: ụgwọ ọrụ Ọ na-akwụ ka mkpụrụ nke afọ bụ.”—ABỤ ỌMA 127:3.
1. Olee otú e si mụọ nwa ọhụrụ mbụ bụ́ mmadụ?
TỤLEE ihe omume ndị dị ebube na-ewere ọnọdụ n’ihi otú Jehova Chineke si kee nwoke na nwanyị mbụ. Ma nna, bụ́ Adam, ma nne, bụ́ Iv, nyere ihe si n’ahụ́ ha bụ́ nke tolitere n’ime akpa nwa Iv ma ghọọ mmadụ ọhụrụ zuru ezu—nwa ọhụrụ mbụ bụ́ mmadụ. (Jenesis 4:1) Ruokwa taa, ịtụrụ ime na ịmụ nwa na-eju anyị anya, ọtụtụ ndị akọwawokwa ya dị ka ọrụ ebube n’ezie.
2. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na ihe na-eme n’akpa nwa nwanyị dị ime bụ ọrụ ebube?
2 N’ime ihe dị ka narị ụbọchị abụọ na iri asaa, mkpụrụ ndụ ahụ e mepụtara n’ahụ́ nne n’ihi mmekọahụ nke ya na nna nwere na-etolite ma ghọọ nwa ọhụrụ nke nwere ọtụtụ puku ijeri mkpụrụ ndụ. Mkpụrụ ndụ mbụ ahụ nwere n’ime ya ihe ọmụma dị mkpa iji mepụta ihe karịrị ụdị narị mkpụrụ ndụ abụọ. N’iji ihe ọmụma ndị a dị egwu, bụ́ ndị mmadụ na-apụghị ịghọta, eme ihe, mkpụrụ ndụ ndị a dị nnọọ mgbagwoju anya na-aghọ akụkụ ahụ́ dị iche iche n’usoro kwesịrị nnọọ ekwesị iji mepụta mmadụ ọhụrụ dị ndụ!
3. Gịnị mere ndị nwere ọgụgụ isi ji ekweta na ọ ghaghị ịbụ Chineke na-eme ka o kwe omume ịmụpụta mmadụ ọhụrụ dị ndụ?
3 Ònyezi ka ị ga-ekwu na ọ bụ ya kere nwa ọhụrụ ahụ n’ezie? O doro anya na ọ bụ Onye ahụ kere ndụ n’onwe ya. Ọbụ abụ nke Bible bụrụ, sị: “Maranụ na Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke: Ya onwe ya emewo anyị, ọ bụkwa Ya nwe anyị.” (Abụ Ọma 100:3) Ndị nne na nna, unu maara nke ọma na ọ bụghị n’ihi na unu nwere ụbụrụ na-aghọ nkọ ka unu ji nwee ike ịmụpụta nwa ọhụrụ a dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụ nanị Chineke nke nwere amamihe na-enweghị nsọtụ pụrụ ime ka mmadụ ọhụrụ dị ndụ tolite n’ime akpa nwa nne ya n’ụzọ ọrụ ebube. Ruo ọtụtụ puku afọ, ndị na-eche echiche enyewo Onye Okike Ukwu anyị otuto dị ka onye na-eme ka nwa ọhụrụ tolite n’ime akpa nwa nne ya. Ị̀ na-eme otú ahụ?—Abụ Ọma 139:13-16.
4. Olee amaghị eme ụmụ mmadụ nke a na-apụtụghị ịsị na Jehova nwere?
4 Otú ọ dị, Jehova ọ̀ bụ Onye Okike nke na-adịghị eche banyere ndị mmadụ bụ́ onye nanị ihe o mere bụ iguzobe usoro ndị nwoke na ndị nwanyị pụrụ isi mụta ụmụ? Ụfọdụ mmadụ anaghị eche banyere ndị ọzọ, ma Jehova adịtụghị otú ahụ. (Abụ Ọma 78:38-40) Bible na-ekwu n’Abụ Ọma 127:3, sị: “Lee, ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ: ụgwọ ọrụ Ọ na-akwụ ka mkpụrụ nke afọ bụ.” Ka anyị tụlezie ihe ihe nketa bụ na ihe ọ na-egosipụta.
Ihe Nketa na Ụgwọ Ọrụ
5. Gịnị mere ụmụ ji bụrụ ihe nketa?
5 Ihe nketa dị ka onyinye. Mgbe mgbe, ndị nne na nna na-arụsi ọrụ ike ruo ogologo oge iji hapụrụ ụmụ ha ihe nketa. Ọ pụrụ ịbụ ego, ala, ma ọ bụ ikekwe ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa. Ihe ọ bụla ọ sọrọ ya bụrụ, ọ na-egosipụta ịhụnanya ndị nne na nna nwere n’ebe ụmụ ha nọ. Bible na-ekwu na Chineke enyewo ndị nne na nna ụmụ ha dị ka ihe nketa. Ha bụ onyinye na-egosi ịhụnanya nke sitere n’aka ya. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị̀ ga-ekwu na omume gị na-egosi na ị na-ele ụmụ gị anya dị ka onyinye Onye kere eluigwe na ala nyere gị?
6. Gịnị bụ nzube Chineke ji mee ka o kwe ụmụ mmadụ omume ịmụ ụmụ?
6 Nzube Jehova ji nye onyinye a bụ iji mee ka ụwa jupụta n’ụmụ sitere n’Adam na Iv. (Jenesis 1:27, 28; Aịsaịa 45:18) Jehova ejighị aka ya kee ndị mmadụ n’otu n’otu dị ka o si kee ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi. (Abụ Ọma 104:4; Mkpughe 4:11) Kama nke ahụ, Chineke họọrọ ike ụmụ mmadụ ka ha nwee ikike nke ịmụpụta ụmụ ndị ga-adị nnọọ ka ha. Lee ihe ùgwù dị ukwuu ọ bụụrụ nne na nna ịmụpụta mmadụ ọhụrụ dị otú ahụ na ilekọta ya! Dị ka ndị nne na nna, ùnu na-ekele Jehova maka ime ka o kwe unu omume inweta ihe nketa a dị oké ọnụ ahịa?
Mụta Ihe Site n’Ihe Nlereanya Jizọs
7. N’adịghị ka ihe ụfọdụ ndị nne na nna na-eme, olee otú Jizọs si gosi mmasị na ọmịiko “n’ebe ụmụ mmadụ nọ”?
7 N’ụzọ dị mwute, ọ bụghị ndị nne na nna nile na-ele ụmụ ha anya dị ka ihe nketa. Ọtụtụ adịghị enwecha ọmịiko n’ahụ́ ụmụ ha. Ndị nne na nna dị otú ahụ adịghị eṅomi àgwà Jehova ma ọ bụ nke Ọkpara ya. (Abụ Ọma 27:10; Aịsaịa 49:15) N’ụzọ dị iche, tụlee mmasị Jizọs nwere n’ebe ụmụaka nọ. Ọbụna tupu Jizọs abịa n’ụwa dị ka mmadụ—mgbe ọ bụ mmụọ dị ike n’eluigwe—Bible na-ekwu na ‘ihe na-atọ ya ụtọ dị n’ebe ụmụ mmadụ nọ.’ (Ilu 8:31) Ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ dị ukwuu nke na ọ dị njikere inye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta ka anyị wee nwee ike inweta ndụ ebighị ebi.—Matiu 20:28; Jọn 10:18.
8. Olee otú Jizọs si setịpụrụ ndị nne na nna ezigbo ihe nlereanya?
8 Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jizọs setịpụụrụ ndị nne na nna ezigbo ihe nlereanya. Tụlee ihe o mere. O wepụtara oge iji soro ụmụaka nọkọọ, ọbụna mgbe o ji nnọọ ọrụ n’aka na mgbe o nwere nrụgide. O kiriri ha ka ha na-egwu egwu n’ọma ahịa ma jiri àgwà ha ụfọdụ mee ihe mgbe ọ na-ezi ihe. (Matiu 11:16, 17) Na njem ikpeazụ o mere gaa Jeruselem, Jizọs maara na ya ga-ata ahụhụ, e gbuokwa ya. Ya mere, mgbe ndị mmadụ kpọtara ụmụntakịrị ka ha hụ ya, ndị na-eso ụzọ Jizọs, ikekwe n’ịgbalị ime ka Jizọs ghara inwekwu nrụgide, nwara ịchụpụ ụmụaka ahụ. Ma Jizọs baara ndị na-eso ụzọ ya mba. N’igosi na ‘ihe na-atọ ya ụtọ dị n’ebe ụmụaka nọ,’ o kwuru, sị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu anwala igbochi ha.”—Mak 10:13, 14.
9. N’ihi gịnị ka ihe anyị na-eme pụrụ iji dị mkpa ọbụna karịa ihe anyị na-ekwu?
9 Anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya Jizọs. Mgbe ụmụaka bịakwutere anyị, olee otú anyị si emeghachi omume—ọbụna mgbe anyị ji ọrụ n’aka? Ọ̀ bụ dị ka Jizọs mere? Ihe dị ụmụaka mkpa, karịsịa site n’aka ndị mụrụ ha, bụ ihe Jizọs dị njikere inye ha—oge na nlebara anya. Ọ bụ eziokwu na okwu ndị dị ka “Ahụrụ m gị n’anya” dị mkpa. Ma, omume na-ada ụda karịa okwu ọnụ. Ịhụnanya gị na-apụta ìhè ọ bụghị nanị n’ihe ị na-ekwu kama karịsịa n’ihe ị na-eme. Ọ na-apụta ìhè ná nlekọta na oge ị na-enye ụmụ gị. Otú ọ dị, o nwere ike ịbụ na ime ihe a nile agaghị arụpụta ihe buru ibu, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ gaghị arụpụta ihe ngwa ngwa otú ị tụrụ anya ya. Ọ chọrọ ndidi. Anyị pụrụ ịmụta inwe ndidi ma ọ bụrụ na anyị eṅomie ụzọ Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe.
Ndidi na Ịhụnanya Jizọs
10. Olee otú Jizọs si kụziere ndị na-eso ụzọ ya ịdị umeala n’obi, hà ghọtara ya na mbụ?
10 Jizọs maara na ndị na-eso ụzọ ya na-asọrịta mpi banyere onye ka ibe ya. Otu ụbọchị ka ya na ndị na-eso ụzọ ya rutesịrị Kapaniọm, ọ jụrụ ha, sị: “‘Gịnị ka unu na-arụrịta ụka ya n’okporo ụzọ?’ Ha gbachiri nkịtị, n’ihi na n’okporo ụzọ ha arụwo ụka n’etiti onwe ha banyere onye ka ukwuu.” Kama ịbakasị ha mbá ahụ́, Jizọs ji ndidi jiri ihe atụ a na-ahụ anya mee ihe ná mgbalị ịkụziri ha ịdị umeala n’obi. (Mak 9:33-37) Ọ̀ rụpụtara ihe a tụrụ anya ya? Ọ rụpụtaghị ya ozugbo. Ihe dị ka ọnwa isii ka e mesịrị, Jems na Jọn gwara nne ha ka ọ gaa gwa Jizọs ka o nye ha ọkwá dị elu n’Alaeze ahụ. Ọzọkwa, Jizọs jiri ndidi gbazie echiche ha.—Matiu 20:20-28.
11. (a) Olee ihe a na-emekarị n’obodo ha nke ndịozi Jizọs na-emeghị mgbe ha na Jizọs batara n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu? (b) Gịnị ka Jizọs mere, mgbalị ya ọ̀ rụpụtara ihe n’oge ahụ?
11 N’oge na-adịghị anya, Ememe Ngabiga nke afọ 33 O.A. ruru, nanị Jizọs na ndịozi ya zukọkwara iji mee ememe ahụ. Ka ha rutere n’ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndịozi 12 ahụ wepụtara onwe ya ịsa ụkwụ uzuzu nke ndị ọzọ bụ́ ihe a na-emekarị n’obodo ha—ọrụ dị ala nke ohu ma ọ bụ nwanyị na-arụ n’ezinụlọ. (1 Samuel 25:41; 1 Timoti 5:10) Lee ka ọ na-aghaghị isiwo wute Jizọs ịhụ na ndị na-eso ụzọ ya nọgidere na-egosi ihe àmà nke ịchọ ọkwá! N’ihi ya, Jizọs sara ụkwụ nke ọ bụla n’ime ha ma gbaa ha nnọọ ume ịgbaso ihe nlereanya ya nke ijere ndị ọzọ ozi. (Jọn 13:4-17) Hà mere nke ahụ? Bible na-ekwu na ka e mesịrị n’uhuruchi nke ụbọchị ahụ “esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ bilitekwara n’etiti ha banyere onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu.”—Luk 22:24.
12. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi ṅomie Jizọs ná mgbalị ha na-eme ịzụlite ụmụ ha?
12 Ndị nne na nna, mgbe ụmụ unu na-anabataghị ndụmọdụ unu, ùnu na-aghọta otú ọ na-aghaghị ịdịworị Jizọs? Cheta na Jizọs akwụsịghị inyere ndịozi ya aka, n’agbanyeghị na o siiri ha ike imeri adịghị ike ha. Ndidi ya mesịrị mịpụta mkpụrụ. (1 Jọn 3:14, 18) Ndị nne na nna, unu kwesịrị iṅomi ịhụnanya na ndidi Jizọs, ghara ịkwụsị mgbalị unu na-eme ịzụlite ụmụ unu.
13. N’ihi gịnị ka nne ma ọ bụ nna na-ekwesịghị iji jiri olu ike chụpụ nwata chọrọ ịjụ ajụjụ?
13 Ọ dị ụmụaka mkpa ịmara na ndị nne na nna ha hụrụ ha n’anya ma nwee mmasị n’ebe ha nọ. Jizọs chọrọ ịma ihe dị ndị na-eso ụzọ ya n’obi, n’ihi ya, o gere ha ntị mgbe ha nwere ajụjụ. Ọ jụrụ ha ihe ha chere banyere ihe ụfọdụ. (Matiu 17:25-27) N’ezie, izi ihe dị irè na-agụnye ige ntị nke ọma na igosi ezi mmasị. Nne ma ọ bụ nna kwesịrị izere iji olu ike achụpụ nwata chọrọ ịjụ ajụjụ, na-ekwu ihe dị ka: “Pụọ ebe a! Ị́ hụghị na m ji ọrụ n’aka?” Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ahụ ji ọrụ n’aka n’ezie, o kwesịrị ịgwa nwa ahụ na ha ga-ekwurịta ihe ahụ mgbe ya mechara ihe ya na-eme. Ndị nne na nna aghaghị ijide n’aka na e kwurịtara ihe ahụ. N’ụzọ dị otú a, nwa ahụ ga-aghọta na nne ma ọ bụ nna ya nwere mmasị n’ebe ọ nọ, ọ ga-adịkwukwa njikere ịkọrọ nne ma ọ bụ nna ya ihe dị ya n’obi.
14. Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ịmụta site n’aka Jizọs banyere igosi ụmụ ha ịhụnanya?
14 Ò kwesịrị ekwesị ndị nne na nna igosi na ha hụrụ ụmụ ha n’anya site n’ikonye ha aka n’olu na ịmakụ ha? Ọzọkwa, ndị nne na nna pụrụ ịmụta ihe site n’aka Jizọs. Bible na-ekwu na o ‘kuuru ụmụaka ahụ n’aka ya wee malite ịgọzi ha, na-ebikwasị ha aka n’isi.’ (Mak 10:16) Olee otú i chere ụmụaka ahụ si meghachi omume? N’ezie, ha nwere obi ụtọ, a dọtakwara ha n’ebe Jizọs nọ! Ọ bụrụ na e nwere ezi ịhụnanya n’etiti unu bụ́ ndị nne na nna na ụmụ unu, ha ga-adịkwu njikere ịnabata mgbalị unu na-eme ịdọ ha aka ná ntị na ịkụziri ha ihe.
Ihe Banyere Oge E Kwesịrị Iji Nọnyere Ụmụaka
15, 16. Olee otu echiche a maara ebe nile banyere ịzụlite ụmụaka, oleekwa ihe o yiri ka ọ̀ bụ ya kpatara ya?
15 Ụfọdụ ndị na-ajụ ma ọ̀ dị ụmụaka mkpa n’ezie ka ndị nne na nna ha na-ewepụta oge dị ukwuu maka ha ma jiri ịhụnanya na-elekọta ha. Otu echiche e nwere banyere ịzụlite ụmụaka, bụ́ nke e jiworo nlezianya kwalite bụ nke a na-akpọ oge bara uru. Ndị na-akwado echiche ahụ na-ekwu na ọ dịghị ụmụaka mkpa ka ndị mụrụ ha wepụta oge dị ukwuu maka ha ma ọ bụrụhaala nnọọ na oge e ji soro ụmụaka nọkọọ bụ nke bara uru, nke e chepụtara nke ọma, na nke a haziri ahazi. Echiche a nke iwepụta oge bara uru ò ziri ezi ma bụrụ nke e bu ọdịmma ụmụaka n’uche chepụta?
16 Otu onye edemede nke ya na ọtụtụ ụmụaka kwurịtara okwu kwuru na “ihe ha kasị chọọ n’aka ndị mụrụ ha bụ ka ndị mụrụ ha na-ewepụtakwu oge maka ha,” nakwa ka ha “na-elebara ha anya n’ụzọ a na-ekewaghị ekewa.” N’ụzọ dị ịrịba ama, otu prọfesọ nke otu kọleji kwuru, sị: “Okwu ahụ [bụ́ oge bara uru] bilitere n’ihi na ndị nne na nna chọpụtara na ha adịghị arụzu ọrụ ha. Ndị mmadụ nọ na-enye onwe ha ihe ngọpụ iji jiri oge dị nta soro ụmụ ha na-anọkọ.” Oge há aṅaa ka ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iji soro ụmụ ha na-anọkọ?
17. Gịnị ka ụmụaka chọrọ n’aka ndị nne na nna ha?
17 Bible ekwughị. Otú ọ dị, a gbara ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel ume iso ụmụ ha na-ekwurịta okwu mgbe ha na-anọdụ n’ụlọ ha, na mgbe ha na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ha na-edina ala, na mgbe ha na-ebili ọtọ. (Deuterọnọmi 6:7) N’ụzọ doro anya, nke a pụtara na ọ dị ndị nne na nna mkpa iso ụmụ ha na-ekwurịta okwu, nakwa izi ha ihe kwa ụbọchị.
18. Olee otú Jizọs si jiri ohere ndị o nwere mee ihe iji zụọ ndị na-eso ụzọ ya, gịnịkwa ka ndị nne na nna pụrụ ịmụta na nke a?
18 Jizọs nwere ihe ịga nke ọma n’inye ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ ka ya na ha na-eri nri, na-eme njem, ọbụna ka ya na ha na-atụrụ ndụ. O si otú ahụ jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe iji kụziere ha ihe. (Mak 6:31, 32; Luk 8:1; 22:14) N’otu aka ahụ, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịmụrụ anya iji ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe iji soro ụmụ ha na-enwe ezi nkwurịta okwu na iji zụọ ha n’ụzọ Jehova.
Ihe A Ga-akụzi na Otú A Ga-esi Kụzie Ya
19. (a) Olee ihe ọzọ dị mkpa ma e wezụga iwepụta oge iji soro ụmụaka nọkọọ? (b) Olee ihe bụ́ isi ndị nne na nna ga-akụziri ụmụ ha?
19 Nanị iso ụmụaka na-anọkọ ma ọ bụ ọbụna iso ha na-ekwurịta okwu ezughị iji nwee ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ha. Ihe ọzọ dị oké mkpa bụ ihe a na-akụzi. Rịba ama otú Bible si mesie ike ihe e kwesịrị ịkụzi. Ọ na-asị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, . . . : ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị.” Gịnị bụ “okwu ndị a” a ga-akụziri ụmụaka? Ihe àmà na-egosi na ọ bụ okwu ndị na-esonụ: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.” (Deuterọnọmi 6:5-7) Jizọs kwuru na nke a bụ nke kachasị mkpa n’ihe nile Chineke nyere n’iwu. (Mak 12:28-30) N’ụzọ bụ́ isi, ọ dị ndị nne na nna mkpa ịkụziri ụmụ ha banyere Jehova, na-akọwara ha ihe mere o ji bụrụ nanị ya ruru eru ka anyị jiri mkpụrụ obi anyị dum hụ ya n’anya ma na-efe ya ofufe.
20. Gịnị ka Chineke nyere ndị nne na nna oge ochie iwu ịkụziri ụmụ ha?
20 Otú ọ dị, “okwu ndị a” bụ́ ndị a gbara ndị nne na nna ume ịkụziri ụmụ ha gụnyere ihe karịrị nanị iji onwe anyị dum hụ Chineke n’anya. Ị ga-ahụ na n’isiakwụkwọ bu nke a ụzọ na Deuterọnọmi, Mozis kwughachiri iwu ndị ahụ Chineke dere ná mbadamba nkume—Iwu Iri ahụ. Iwu ndị a gụnyere ndị na-ekwu ka a ghara ịgha ụgha, izu ohi, igbu mmadụ na ịkwa iko. (Deuterọnọmi 5:11-22) Nke a na-egosi na e mere ka ndị nne na nna oge ochie mata mkpa ọ dị ịkụnye ụkpụrụ omume ọma n’ime ụmụ ha. Ọ dị ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst taa mkpa inye ụmụ ha ntụziaka yiri nke ahụ ma ọ bụrụ na ha ga-enyere ha aka inwe obi iru ala na obi ụtọ n’ọdịnihu.
21. Gịnị ka ntụziaka ahụ bụ́ “izi” ụmụaka okwu Chineke pụtara?
21 Rịba ama na a gwara ndị nne na nna otú ha ga-esi na-ezi ụmụ ha “okwu ndị a,” ma ọ bụ iwu ndị a: “Ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị.” Okwu ahụ bụ́ “izi” pụtara “ikwughachi; ikwu ugboro ugboro; ịgba ume ma ọ bụ ime ka ihe bamie n’obi nke ọma.” Ya mere, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Chineke na-agwa ndị nne na nna ka ha guzobe usoro ihe omume a haziri ahazi nke inye ntụziaka ndị sitere na Bible ná nzube nke ịkụnye ihe ime mmụọ n’obi ụmụ ha.
22. Gịnị ka a gwara ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel ka ha mee iji na-ezi ụmụ ha ihe, gịnịkwa ka nke ahụ pụtara?
22 Usoro ihe omume dị otú ahụ a haziri ahazi na-achọ ka ndị nne na nna buru ụzọ na-eme ihe. Bible na-ekwu, sị: “Ị ga-ekekwa ha [“okwu ndị a,” ma ọ bụ iwu Chineke] n’elu aka gị ka ha bụrụ ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa mkpọ n’ihu n’etiti anya gị abụọ. Ị ga-edekwasịkwa ha n’awara ụzọ abụọ nke ụlọ gị, na n’ọnụ ụzọ ámá gị nile.” (Deuterọnọmi 6:8, 9) Nke a apụtaghị na ndị nne na nna ga-ede iwu Chineke n’ụzọ nkịtị n’awara ụzọ na n’ọnụ ụzọ ámá ha ma ọ bụ kee ha n’aka ụmụ ha ma ọ bụ kenye ha n’etiti anya ha abụọ. Kama nke ahụ, ihe ọ pụtara bụ na ndị nne na nna kwesịrị ịdị na-akụziri ụmụ ha banyere Chineke mgbe nile. Ha kwesịrị nnọọ ịnọgide na-ezi ụmụ ha ihe mgbe nile ruo n’ókè nke na ọ ga-adị ka è debere ozizi Chineke n’ihu ụmụ ha mgbe nile.
23. Gịnị ka a ga-atụle n’izu na-esonụ?
23 Olee ụfọdụ ihe ndị dị mkpa ka ndị nne na nna kụziere ụmụ ha? Gịnị mere o ji dị oké mkpa taa ịkụziri na ịzụ ụmụaka inwe ike ichebe onwe ha? Olee ihe enyemaka ndị nne na nna nwere ugbu a iji nyere ha aka izi ụmụ ha ihe n’ụzọ gara nke ọma? A ga-aza ajụjụ ndị a na ndị ọzọ metụtara ndị nne na nna n’isiokwu na-esonụ.
-
-
Ndị Nne na Nna, Chebenụ Ihe Nketa Unu Dị Oké Ọnụ AhịaỤlọ Nche—2005 | Eprel 1
-
-
Ndị Nne na Nna, Chebenụ Ihe Nketa Unu Dị Oké Ọnụ Ahịa
“Amamihe bụ ndò . . . [ọ] na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.”—Eklisiastis 7:12.
1. N’ihi gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị iji na-ele ụmụ ha anya dị ka onyinye?
NDỊ NNE NA NNA na-amụpụta mmadụ ọhụrụ dị ndụ nke yiri ha n’ọdịdị na n’àgwà. Bible na-akpọ ụmụaka dị otú ahụ “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa.” (Abụ Ọma 127:3) Ebe ọ bụ ya bụ ezi Onye Na-enye Ndụ, Jehova na-enyefe nnọọ ndị nne na nna ihe bụ́ nke Ya n’ezie. (Abụ Ọma 36:9) Ndị nne na nna, olee otú unu si ele ịnata onyinye dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka Chineke anya?
2. Gịnị ka Manoa mere mgbe ọ matara na ya ga-aghọ nna?
2 N’ezie, e kwesịrị iji umeala n’obi na ekele nara onyinye dị otú ahụ. Ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, onye Izrel bụ́ Manoa mere otú ahụ mgbe otu mmụọ ozi gwara nwunye ya na ọ ga-amụ nwa. Mgbe ọ nụrụ ozi ọma ahụ, Manoa kpere ekpere, sị: “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ nke I zitere bịaghachikwute anyị ọzọ, arịọ m Gị, ka o zikwa anyị ihe anyị ga-eme nwata ahụ nke a ga-amụ.” (Ndị Ikpe 13:8) Ndị nne na nna, gịnị ka unu pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Manoa?
Ihe Mere Enyemaka Chineke Ji Dị Mkpa Ugbu A
3. N’ihi gịnị ka enyemaka Chineke ji dị ezigbo mkpa n’ịzụlite ụmụaka taa?
3 Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, enyemaka Jehova dị ndị nne na nna mkpa ugbu a n’ịzụlite ụmụ ha. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? E siwo n’eluigwe chụdata Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya n’ụwa. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:7-9, 12) Bible na-akọwa na “dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ,” Setan “na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Ọdụm na-awakpokarị anụ ndị ọ ga-adọgbuli, ọ na-abụkarịkwa ndị ka dị obere. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eji amamihe elegara Jehova anya maka nduzi iji chebe ụmụ ha. Mgbalị há aṅaa ka ị na-eme iji mee otú ahụ?
4. (a) Ịmata na ọdụm na-akpagharị n’ógbè ha kwesịrị ime ka ndị nne na nna mee gịnị? (b) Gịnị dị ụmụaka mkpa iji bụrụ ndị e chebere?
4 Ọ bụrụ na ị maara na ọdụm na-akpagharị n’ógbè unu, n’ezie nchegbu gị bụ́ isi ga-abụ ichebe ụmụ gị. Setan yiri anụ na-adọgbu adọgbu. Ọ na-achọ imerụ obi nke ndị Chineke, si otú ahụ mee ka ihe ha gharazie ịmasị Chineke. (Job 2:1-7; 1 Jọn 5:19) Ụmụaka na-adịrị ya mfe nnweta. Iji zere ọnyà Ekwensu, ụmụaka aghaghị ịmara Jehova ma na-erubere ya isi. Ihe ọmụma Bible dị ha oké mkpa iji mee nke a. Jizọs kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Tụkwasị na nke ahụ, amamihe—ikike nke ịghọta ihe na itinye ihe ha mụtara n’ọrụ—dị ụmụaka mkpa. Ebe ọ bụ na “amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ,” ọ dị unu bụ́ ndị nne na nna mkpa ịkụnye eziokwu ahụ n’ime obi ụmụ unu. (Eklisiastis 7:12) Olee otú unu pụrụ isi mee nke a?
5. (a) Olee otú a pụrụ isi kụnye amamihe n’ime ụmụaka? (b) Olee otú Ilu si kọwaa uru amamihe bara?
5 Ị pụrụ—i kwesịkwara—ịdị na-agụrụ ụmụ gị Okwu Chineke. Ma inyere ha aka ịhụ Jehova n’anya na irubere ya isi chọrọ ihe karịrị nke ahụ—ọ chọrọ ha inwe nghọta. Iji maa atụ: A pụrụ ịgwa nwata ka o buru ụzọ lee anya n’aka nri na n’aka ekpe tupu ya agafee okporo ámá. Ma, ụmụaka ụfọdụ adịghị eme otú ahụ. N’ihi gịnị? Ọ pụrụ ịbụ na a kọwabeghịrị nwata ahụ ọtụtụ ugboro na ụgbọala pụrụ ịkụtu ya ma ọ bụ kọwaara ya ya n’ụzọ ga-eme ka ọ ghọta ihe ize ndụ dị na ya, si otú ahụ wepụ “uche gbagọrọ agbagọ” nke pụrụ ime ka ọ daba n’ihe mberede. Ịkụnye amamihe n’ime ụmụaka na-ewe oge, ọ na-achọkwa ndidi. Ma lee ka amamihe si baa uru! Bible na-ekwu, sị: “Ụzọ ya nile bụ ụzọ nke ịdị ụtọ, okporo ụzọ ya nile bụkwa udo. Osisi na-enye ndụ ka ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka: ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye ihe na-agara nke ọma.”—Ilu 3:13-18; 22:15.
Izi Ihe nke Na-eme Ka Mmadụ Mara Ihe
6. (a) Olee ihe na-akpatakarị ụmụaka ime ihe ndị amamihe na-adịghị na ha? (b) Olee ọgụ na-aga n’ihu?
6 Mgbe mgbe, ihe mere ụmụaka ji eme ihe na-adịghị mma abụghị n’ihi na a kụzibeghịrị ha ime ihe ziri ezi, kama ọ bụ n’ihi na ihe a na-akụziri ha erubeghị ha n’obi—ma ọ bụ baa ha n’ime. Ekwensu na-ebu agha iji nweta obi ụmụaka. Ọ na-eme atụmatụ ịhụ na mmụọ asọpụrụghị Chineke nke ụwa a metụtara ha. Ọ na-agbalịkwa iji ọchịchọ ime mmehie bụ́ nke ha bu pụta ụwa eme ihe iji kpalie ha ime ihe ọjọọ. (Jenesis 8:21; Abụ Ọma 51:5) Ọ dị ndị nne na nna mkpa ịghọta na a na-alụ ọgụ siri ike inweta obi ụmụ ha.
7. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị zuo ezuo ịgwa nwata ihe bụ́ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ?
7 Ndị nne na nna na-agwakarị nwa ha ihe bụ́ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ, na-eche na ha akụziworo ya ụkpụrụ omume ọma. Ha pụrụ ịgwa nwa ahụ na ịgha ụgha, izu ohi, ma ọ bụ iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye mmadụ enwe mmekọahụ adịghị mma. Otú ọ dị, ọ dị nwa ahụ mkpa inwe ihe ka sie ike ga-akpali ya irube isi kama ịbụ nanị n’ihi na ndị nne na nna ya gwara ya mee otú ahụ. Ọ bụ iwu Jehova pụrụ ime nke ahụ. Nwata ahụ kwesịrị ịmụta na ọ bụ ihe amamihe dị na ya irubere iwu Chineke isi.—Ilu 6:16-19; Ndị Hibru 13:4.
8. Olee ụdị izi ihe pụrụ ime ka ụmụaka na-akpa àgwà ka ndị maara ihe?
8 Ịdị mgbagwoju anya nke eluigwe na ala, ụbara nke ihe ndị e kere eke, mgbanwe nke oge ndị a na-enwe n’afọ—ihe ndị dị otú a pụchara inyere nwata aka ịghọta na e nwere Onye Okike nke maara ihe nile. (Ndị Rom 1:20; Ndị Hibru 3:4) Ọzọkwa, e kwesịrị ịkụziri nwata ahụ na Chineke hụrụ ya n’anya, na o mewokwa ndokwa site n’àjà mgbapụta nke Ọkpara Ya inye ya ndụ agwụghị agwụ nakwa na ọ pụrụ ime Chineke obi ụtọ site n’irube isi n’ihe Ọ na-ekwu. Mgbe ahụ, o yiri ka nwata ahụ ọ̀ ga-achọ ijere Jehova ozi, n’agbanyeghị mgbalị Ekwensu na-eme iji kwụsị ya.—Ilu 22:6; 27:11; Jọn 3:16.
9. (a) Gịnị ka izi ihe nke na-echebe ndụ na-achọ? (b) Gịnị ka a gwara ndị nna ka ha mee, gịnịkwa ka nke a na-agụnye?
9 Ụdị izi ihe na-echebe nwata ma na-akpali ya ime ihe ziri ezi na-ewe oge, chọọkwa nlebara anya na nhazi. Ọ na-achọ ka ndị nne na nna kwere ka Chineke duzie ha. Bible na-ekwu, sị: “Ndị bụ́ nna, . . . nọgidenụ na-azụlite [ụmụ unu] n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Gịnị ka nke ahụ pụtara? Na Grik mbụ, “nduzi echiche” na-enye echiche nke “itinye uche n’ime.” Ya mere, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, a gbara ndị nna ume itinye uche Jehova n’ime ụmụ ha. Lee ihe nchebe nke ahụ ga-abụrụ ụmụaka! Ọ bụrụ na a kụnye echiche Chineke, ya bụ, ụzọ o si eche echiche, n’ime obi ha, ọ ga-echebe ha pụọ n’ime ihe ọjọọ.
Ọchịchọ nke Ịhụnanya Kwaliri
10. Iji duzie nwa gị n’ụzọ dị irè, gịnị ka ọ dị mkpa ka ị mara?
10 Otú ọ dị, iji mezuo ọchịchọ gị nke ịzụlite nwa gị n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ dị mkpa ka ọ bụrụ ịhụnanya na-akwali mgbalị gị. Otu ihe dị mkpa bụ ezi nkwurịta okwu. Chọpụta ihe na-aga ná ndụ nwa gị na ihe ọ na-eche. N’oge ahụ́ ruru nwa gị ala, jiri akọ jụpụta ya ihe dị ya n’obi. Mgbe ụfọdụ, ihe ọ ga-ekwu pụrụ iju gị anya. Kpachara anya ka ị ghara ime ihe n’iwe. Kama nke ahụ, jiri ọmịiko gee ya ntị.
11. Olee otú nne ma ọ bụ nna pụrụ isi tinye uche Chineke n’ime nwa ya?
11 N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ị gụworo nwa gị iwu Chineke ndị megidere mmekọahụ rụrụ arụ site na Bible, ọbụna mee nke ahụ ọtụtụ ugboro. (1 Ndị Kọrint 6:18; Ndị Efesọs 5:5) Nke a pụrụ imewo ka ụmụ gị mata ihe ndị na-atọ Jehova ụtọ na ihe ndị na-adịghị atọ ya ụtọ. Otú ọ dị, itinye uche ya n’obi ụmụaka chọrọ ihe karịrị nke ahụ. Ọ dị mkpa ka e nyere ụmụaka aka ịtụgharị uche n’abamuru nke iwu Jehova. Ọ dị mkpa ka e mee ka ha kweta na iwu ya ziri ezi ma baa uru, nakwa na irubere ha isi bụ ihe kwesịrị ekwesị na ihe na-egosi ịhụnanya. Ọ bụ nanị mgbe i sooro ụmụ gị tụgharịa uche n’Akwụkwọ Nsọ ruo n’ókè nke na ha nakweere echiche Chineke ka a pụrụ ikwu na i tinyewo uche ya n’ime ụmụ gị.
12. Olee otú nne ma ọ bụ nna pụrụ isi nyere nwa ya aka inwe echiche ziri ezi banyere mmekọahụ?
12 Mgbe a na-ekwu okwu banyere mmekọahụ, ị pụrụ ịjụ, sị, “Ì chere na irube isi n’iwu Jehova nke sịrị ka mmadụ ghara ịkwa iko tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye ga-eme ka onye ahụ ghara inwe obi ụtọ?” Gbaa nwa gị ume ịkọwa ihe ọ zara. Mgbe i sosịrị ya tụlee ndokwa magburu onwe ya Chineke mere maka ịmụ nwa, ị pụrụ ịjụ, sị: “Ì chere na Chineke anyị na-ahụ n’anya ga-enye iwu ndị ga-anapụ anyị obi ụtọ ná ndụ? Ka ì chere na iwu ndị o nyere bụ iji mee ka anyị nwee obi ụtọ ma chebe anyị?” (Abụ Ọma 119:1, 2; Aịsaịa 48:17) Chọpụta ihe bụ́ echiche nwa gị n’okwu a. Mgbe ahụ, ị pụrụ ịdọrọ echiche ya gaa n’ihe atụ ndị gosiri otú mmekọahụ rụrụ arụ si duga n’obi mgbawa na nsogbu. (2 Samuel 13:1-33) Site n’iso nwa gị tụgharịa uche n’ụzọ ga-eme ka ọ ghọta ma nakwere echiche Chineke, ị ga-arụwo ọrụ dị ukwuu n’itinye echiche Chineke n’ime nwa gị. Otú ọ dị, ọ dị ihe ọzọ ị pụrụ ime.
13. Ịghọta gịnị ga-akpali nnọọ nwata irubere Jehova isi?
13 N’iji amamihe eme ihe, ihe ị ga-akụziri nwa gị abụghị nanị ihe ndị na-esi n’erubeghịrị Jehova isi apụta, kama nke ahụ, ị ga-akọwakwara ya otú ụzọ anyị si ebi ndụ si emetụta Jehova. Gosi nwa gị site na Bible na anyị pụrụ ịkpatara Jehova mwute mgbe anyị na-emeghị uche ya. (Abụ Ọma 78:41) Ị pụrụ ịjụ, sị, “Gịnị mere na ị chọghị ime ihe ga-ewute Jehova?” ma kọwaa, sị: “Onye iro Chineke bụ́ Setan na-ekwu na anyị na-ejere Jehova ozi nanị n’ihi ọdịmma onwe anyị ọ bụghị n’ihi na anyị hụrụ Ya n’anya.” Mgbe ahụ, kọwaa na site n’iguzosi ike n’ezi ihe, Job mere ka obi Chineke ṅụrịa, si otú a nye azịza maka ebubo ụgha Setan. (Job 1:9-11; 27:5) Ọ dị nwa gị mkpa ịghọta na dabere n’otú o si akpa àgwà, ọ pụrụ ịkpatara Jehova mwute ma ọ bụ mee ya obi ụtọ. (Ilu 27:11) A pụrụ iji akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụa kụziere ụmụaka nke a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa.
Ezi Ihe Ndị A Rụpụtara
14, 15. (a) Olee ihe ọmụmụ ndị dị n’akwụkwọ Onye Ozizi bụ́ ndị kpaliworo ụmụaka ime ihe? (b) Olee ihe ndị dị mma ị rụpụtaworo site n’iji akwụkwọ ahụ eme ihe? (Leekwa igbe dị na peeji nke 18-19.)
14 Otu nna ochie na Croatia bụ́ onye na-agụrụ nwa nwa ya dị afọ asaa akwụkwọ Onye Ozizi dere na nwa nwa ya ahụ gwara ya ihe ndị a: “Ọ dị ihe mama m gwara m ka m mee, ma achọghị m ime ya. Mgbe ahụ, echetara m isiokwu bụ́ ‘Nrubeisi Na-echebe Gị,’ n’ihi ya, m gara gwa ya na m ga-erubere ya isi.” Otu di na nwunye na Florida, U.S.A., kwuru banyere isiokwu bụ́ “Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Na-agha Ụgha,” sị: “O nwere ajụjụ ndị na-eme ka ụmụaka kwupụta ihe dị ha n’obi ma nakwere ihe ndị ha mejọrọ bụ́ ndị ha na-agaraghị anakwere.”
15 Akwụkwọ Onye Ozizi nwere ihe karịrị narị ihe osise abụọ na iri atọ, o nwekwara okwu nkọwa maka ihe osise nke ọ bụla ma ọ bụ ihe osise ndị nọkọtara ọnụ. Otu nne nke nwere obi ekele kwuru, sị: “Mgbe mgbe, nwa m nwoke na-elegide anya n’otu ihe osise nke na ọ gaghị achọ ka a safee peeji ahụ. Ọ bụghị nanị na ihe osise ndị ahụ na-adọrọ mmasị kama ha na-akụzi ihe n’onwe ha, ma ọ bụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, na-akpali ụmụaka ịjụ ajụjụ. Banyere otu ihe osise ebe otu nwatakịrị na-ekiri telivishọn n’ụlọ gbara ọchịchịrị, nwa m nwoke jiri olu gosiri na ọ maara na nwatakịrị ahụ na-eme ihe na-adịghị mma jụọ m, sị, ‘Mama, gịnị ka nwa a na-eme?’” Okwu nkọwa nke ihe osise ahụ na-agụ, sị: “Ònye pụrụ ịhụ ihe nile anyị na-eme?”
Izi Ihe nke Dị Oké Mkpa Taa
16. Gịnị ka ọ dị oké mkpa ka a kụziere ụmụaka taa, n’ihi gịnịkwa?
16 Ọ dị ụmụaka mkpa ịmata ụzọ kwesịrị ekwesị na nke na-ekwesịghị ekwesị isi eji akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ eme ihe. Ma, ikwurịta nke a adịghị adịcha mfe mgbe nile. Otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ kwuru na ya tolitere n’oge a na-ele iji okwu ndị na-ezo aka n’akụkụ ahụ́ ndị e ji enwe mmekọahụ eme ihe anya dị ka ihe na-egosi enweghị nsọpụrụ. N’ikwu banyere ịkụziri ụmụ ya ihe, o dere, sị: “Aghaghị m ịkwụsị ime ihere.” N’ezie, mgbe ndị nne na nna zeere iso nwa ha kwurịta ihe metụtara mmekọahụ n’ihi ihere, ọ dịghị echebe ya. Ọ na-adịrị ndị na-emetọ ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ mfe ime otú ahụ n’ihi na nwatakịrị ahụ amaghị ihe banyere mmekọahụ. Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ tụlere okwu ahụ n’ụzọ na-ewuli elu ma dị ùgwù. Ịkọwara ụmụaka banyere mmekọahụ adịghị eme ka ha mara ihe karịrị ha, ma emeghị otú ahụ pụrụ ime ka e metọọ ha.
17. Olee otú akwụkwọ Onye Ozizi si enyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha banyere mmekọahụ?
17 N’isi nke 10, mgbe ọ na-ekwu banyere ajọ ndị mmụọ ozi bụ́ ndị bịara n’ụwa ma mụọ ụmụ, akwụkwọ ahụ jụrụ nwata ajụjụ bụ́, “Gịnị ka ị maara banyere inwe mmekọahụ?” Akwụkwọ ahụ nyere azịza dị mfe ma dị ùgwù. Isi nke 32 kọwaziri otú a pụrụ isi chebe ụmụaka pụọ n’aka ndị na-achọ imetọ ha n’ụzọ mmekọahụ. Ọtụtụ akwụkwọ ozi ndị e nwetara na-egosi na izi ihe dị otú a dị oké mkpa. Otu nne dere, sị: “N’izu gara aga, mgbe mụ na nwa m nwoke bụ́ Javan gara ịhụ dọkịta ya, ọ jụrụ ma ànyị akọwaworo nwa anyị nwoke ụzọ kwesịrị ekwesị isi eji akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ eme ihe. Obi dị ya nnọọ ụtọ na anyị ejirila akwụkwọ ọhụrụ ahụ mee otú ahụ.”
18. Olee otú akwụkwọ Onye Ozizi si kụzie ihe banyere ịkwanyere ihe nnọchianya mba ùgwù?
18 Isiokwu ọzọ tụlere banyere ihe ndekọ Bible nke ụmụ okorobịa Hibru atọ bụ́ Shedrak, Mishak na Abednego, bụ́ ndị jụrụ ịkpọ isiala nye ihe oyiyi na-anọchi anya mba Babilọn. (Daniel 3:1-30) Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ echeghị na ịkwanyere ihe oyiyi ùgwù na ikele ọkọlọtọ nwere njikọ, dị ka akwụkwọ Onye Ozizi si kwuo. Otú ọ dị, rịba ama ihe onye edemede bụ́ Edward Gaffney nwere ikwu n’ajụjụ ọnụ magazin U.S. Catholic gbara ya. O kwuru na ụbọchị mbụ nwa ya nwanyị gara ụlọ akwụkwọ, na ọ lọtara ma gwa ya na ya amụtala “ekpere ọhụrụ n’ụlọ akwụkwọ,” ọ gwara nwa ya nwanyị ka o kpee ya ka ya nụ. Gaffney kwuru, sị: “Nwa m nwanyị tụkwasịrị aka ya n’obi ya ma jiri nganga malite ikwu, sị, Ana m ekwe nkwa ikwesị ntụkwasị obi nye ọkọlọtọ anyị. . . . ’” Gaffney gara n’ihu kwuo, sị: “Anya mepere m ozugbo ahụ. Ihe Ndịàmà Jehova kwuru bụ eziokwu. Ọ dị okpukpe mba a na-akụziri obere ụmụaka anyị n’ụlọ akwụkwọ—ikwesị ntụkwasị obi zuru nnọọ ezu.”
O Kwesịrị Mgbalị Ndị E Mere Maka Ya
19. Olee ụgwọ a na-enweta site n’ịkụziri ụmụaka ihe?
19 N’ezie, ịkụziri ụmụ gị ihe kwesịrị mgbalị nile i mere maka ya. Anya mmiri gbara otu nwanyị bi na Kansas, U.S.A., mgbe ọ natara akwụkwọ ozi nke nwa ya nwoke deere ya. Nwa ya nwoke dere, sị: “Echere m na enwere m ihe ndabara ọma ịbụ onye e nyere ọzụzụ nke mere ka m na-echezi echiche echezi. Gị na papa m kwesịrị nnọọ ịja mma.” (Ilu 31:28) Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ka pụrụ inyere ọtụtụ ndị nne na nna aka izi ụmụ ha ihe iji chebe ihe nketa a dị oké ọnụ ahịa.
20. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ịdị na-echeta mgbe nile, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke ahụ kwesịrị inwe n’ahụ́ ha?
20 Oge, nlebara anya, na mgbalị nile anyị pụrụ inye ụmụ anyị kwesịịrị ha. Ha ga-abụ ụmụaka ruo nanị nwa oge. Jiri ohere ọ bụla mee ihe iji soro ha na-anọkọ ma na-enyere ha aka. Ị gaghị akwa ụta ọ bụla maka ime otú ahụ. Ha ga-ahụ gị n’anya. Na-echeta mgbe nile na ụmụ gị bụ onyinye Chineke nyere gị. Lee ihe nketa dị oké ọnụ ahịa ha bụ! (Abụ Ọma 127:3-5) Ya mere, na-emeso ha ihe dị ka ihe nketa dị oké ọnụ ahịa, dị ka onye ga-aza Chineke ajụjụ banyere otú i si zụlite ha, n’ihi na nke bụ́ eziokwu bụ na, ị ga-aza ajụjụ banyere ha.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Lee isi nke 40, “Ụzọ Isi Mee Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ.”
-