-
Ụba Ihe Onwunwe Pụrụ Itinye Okwukwe Gị N’uleỤlọ Nche—1993 | Julaị 15
-
-
N’imesị n’ikpeazụ chọpụta na echiche ya ezighị ezi, Esaf kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a sịwo m, M ga-akọ akụkọ otú a; lee, ọ bụ ọgbọ nke ụmụ gị ka m ga-aghọgbuworị. M wee chee echiche ịmata nke a, ndọgbu onwe m n’ọrụ ka ọ bụ n’anya m; ruo mgbe m na-aba n’ebe nsọ nile nke Chineke, ghọta ikpeazụ ha. N’ezie ọ bụ n’ebe nile na-alọ alọ ka ị na-edo ha: i mewo ka ha daruo ntikpọ. Hà siri aṅaa ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu n’otu ntabi anya? Ha agwụwo gwụsịa site n’ihe egwu dị iche iche. Dị ka nrọ mgbe mmadụ na-eteta n’ụra; otú a, Onyenwe anyị, mgbe ị ga-akpọte onwe gị, ị ga-eleda onyinyo ha anya.”—Abụ Ọma 73:15-20.
-
-
Ụba Ihe Onwunwe Pụrụ Itinye Okwukwe Gị N’uleỤlọ Nche—1993 | Julaị 15
-
-
Esaf mesịrị ghọta na Chineke edowo ndị ajọ omume ‘n’ebe na-alọ alọ.’ N’ihi na ndụ ha na-adabere n’ihe onwunwe, ha nọ n’ihe ize ndụ nke inwe ahụmahụ ntikpọ mberede. Ya dịkarịa anya, ha gaje ịnwụ n’oge agadi ha, akụ na ụba ha kpatara n’ụzọ ọjọọ agaghị ewetara ha ogologo ndụ karị. (Abụ Ọma 49:6-12) Ụba ha ga-adị ka nrọ na-agabiga ngwa ngwa. Ihe ọjọọ ha mere pụrụ ọbụna iwetara ha nsogbu tupu ha emee agadi ka ha nọ na-aghọrọ mkpụrụ ha kụrụ. (Ndị Galetia 6:7) Ebe ọ bụ na ha echewo azụ ha n’ebe Onye ahụ nke nanị ya pụrụ inyere ha aka nọ, ha nọ n’enweghị enyemaka, n’enweghị olileanya. Mgbe Jehova mere ihe megide ha, ọ ga-ele “onyinyo” ha anya—ọkwá na ọnọdụ ha—ná nleda anya.
-