-
“Debe Ihe Nile M Nyere N’iwu, Wee Dị Ndụ”Ụlọ Nche—2000 | Nọvemba 15
-
-
Solomọn na-akọ, sị: “Nwa okorobịa ahụ na-ejeso ya na mberede. Dị ka ehi si abịa n’ogbugbu ya, ma ọ bụ dị ka mkpọrọ ukwu si abịa n’ịdọ aka ná ntị nke onye gbagọrọ agbagọ n’uche ya; ruo mgbe akụ́ ga-eji gbapuo imeju ya; dị ka nnụnụ si eme ngwa ịba n’igbudu, ma ọ maghị na imegide ndụ ya ka ọ bụ.”—Ilu 7:22, 23.
Òkù ahụ ghọọrọ nwa okorobịa ahụ ihe a na-apụghị iguzogide eguzogide. N’ileghara ezi uche anya, ọ na-ejeso ya ‘dị ka ehi a na-aga igbu egbu.’ Dị ka onye a tụrụ mkpọrọ na-apụghị ịgbanahụ ntaramahụhụ ya, otú ahụ ka a rabara nwa okorobịa ahụ ná mmehie. Ọ dịghị ahụ ihe ize ndụ dị n’ihe ahụ nile ruo mgbe “akụ̀ ga-eji gbapuo imeju ya,” ya bụ, ruo mgbe o nwetara ọnyá nke pụrụ ịkpatara ya ọnwụ. Ọnwụ ahụ pụrụ ịbụ nke anụ ahụ n’echiche bụ́ na ọ na-ekpughe onwe ya nye ọrịa ndị na-eweta ọnwụ bụ́ ndị a na-ebute site ná mmekọahụ.b Ọnyá ahụ pụkwara ime ka ọ nwụọ n’ụzọ ime mmụọ; “imegide ndụ ya ka ọ bụ.” Ọ na-emetụta ịdị adị ya dum nakwa ndụ ya n’ụzọ siri ike, o mewokwa oké mmehie megide Chineke. O si otú ahụ na-agbaga n’ọnwụ dị ka nnụnụ si ama n’ọnyà!
-
-
“Debe Ihe Nile M Nyere N’iwu, Wee Dị Ndụ”Ụlọ Nche—2000 | Nọvemba 15
-
-
b Ụfọdụ ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ na-emebi imeju. Dị ka ihe atụ, n’ihe banyere ọrịa ụfụ mamịrị nke nọteworo aka, ụmụ nje ọrịa na-eme ka imeju gharazie ịdị ike. Nje na-ebutekwa nsí nwanyị pụrụ ịkpata ọzịza nke imeju.
-