-
“Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke” n’Ụzọ Unu Si Eji Ike Eme IheBịaruo Jehova Nso
-
-
10. (a) Chineke enyewo ndị nne na nna ikike dị aṅaa? (b) Gịnị ka okwu bụ́ “ọzụzụ” pụtara, oleekwa otú e kwesịrị isi na-enye ya? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)
10 Ndị nne na nna nwekwara ikike Chineke nyere ha. Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Na Bible, okwu ahụ bụ́ “ọzụzụ” pụrụ ịpụta “nzụlite, ntụziaka.” Ọzụzụ dị ụmụaka mkpa; ha na-eme nke ọma mgbe e nyere ha ụkpụrụ nduzi ndị doro anya ma gwa ha kpọmkwem ihe ndị ha nwere ike ime na ndị ha na-agaghị eme. Bible na-ejikọta ọzụzụ ma ọ bụ ntụziaka dị otú ahụ, na ịhụnanya. (Ilu 13:24) N’ihi ya, e kwesịtụghị iji “mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị” mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi—n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ anụ ahụ́.a (Ilu 22:15; 29:15) Ọzụzụ nke sibigara ike ókè ma ọ bụ nke e ji aka ike na-enye n’ụzọ na-egositụghị ịhụnanya bụ iji ikike e nyere ndị nne na nna na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ pụkwara igbu mmụọ nwatakịrị. (Ndị Kọlọsi 3:21) N’aka nke ọzọ, ọzụzụ ziri ezi, bụ́ nke a na-enye n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-eme ka ụmụaka ghọta na ndị mụrụ ha hụrụ ha n’anya ma na-enwe nchegbu banyere ụdị mmadụ ha na-aghọ.
-
-
“Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke” n’Ụzọ Unu Si Eji Ike Eme IheBịaruo Jehova Nso
-
-
a N’oge Bible, okwu Hibru maka “mkpanaka” pụtara osisi ma ọ bụ mkpara, dị ka nke onye ọzụzụ atụrụ na-eji eduzi atụrụ ya. (Abụ Ọma 23:4) N’ụzọ yiri nke ahụ, “mkpanaka” nke ikike nne na nna nwere na-enye echiche nduzi ịhụnanya, ọ bụghị nke ntaramahụhụ e ji aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ na-enye.
-