-
‘Mkpụrụ Obi Gị Ga-ehulata n’Ebe M Nọ’Ụlọ Nche—2012 | Jun 1
-
-
MMADỤ ịdị umeala n’obi amaka. Anyị hụ onye dị umeala n’obi, ọ na-amasị anyị ka anyị na onye ahụ na-akpa. Ma ọ dị mwute na ọtụtụ ndị n’ụwa taa adịghị umeala n’obi, karịchaa, ndị isi ma ọ bụ ndị nọ n’ọkwá dị elu. Oleekwanụ maka Jehova Chineke, bụ́ Onye na-enweghị onye ya na ya hà, ma n’eluigwe ma n’ụwa? Ọ̀ dị umeala n’obi? Ka anyị hụ ihe Jeremaya onye amụma kwuru n’Abụ Ákwá 3:20, 21.—Gụọ.
-
-
‘Mkpụrụ Obi Gị Ga-ehulata n’Ebe M Nọ’Ụlọ Nche—2012 | Jun 1
-
-
O doro Jeremaya anya na Jehova ‘ga-ehulata’ n’ebe ndị ya ji obi ha niile chegharịa nọ. Okwu ndị a na-eme ka anyị ghọta na Jehova dị obiọma. Ihe ọ pụtara bụ na Jehova, “Onye Kasị Elu n’ụwa niile,” ga-ehulata ma si n’ọnọdụ ọjọọ ndị na-efe ya nọ kulite ha, meekwa ka ya na ha dịghachi ná mma. (Abụ Ọma 83:18) Olileanya Jeremaya nwere kasiri ya obi. N’ihi ya, onye amụma a kpebisiri ike ịtachi obi ma chere Jehova ruo mgbe Jehova ga-anapụta ndị Ya chegharịrị echegharị.—Amaokwu nke 21.
-