Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ogologo Oge Hà Aṅaa Fọdụụrụ Ndị Ajọ Omume?
    Ụlọ Nche—2000 | Febụwarị 1
    • 9 Habakuk na-aṅa ntị nke ọma n’ihe ndị ọzọ Chineke na-ekwu, ndị e dekọrọ na Habakuk 1:6-11. Nke a bụ ozi Jehova—ọ dịghịkwa chi ụgha ma ọ bụ arụsị na-adịghị ndụ pụrụ igbochi mmezu ya: “Lee, M gaje ime ka ndị Kaldea bilie, bụ́ mba ahụ dị ilu nke na-emekwa ngwa ngwa; ndị na-ejegharị na mbara ụwa, inweta ebe obibi dị iche iche nke na-abụghị nke ha. Ndị a na-atụ ụjọ, ndị dịkwa egwu, ka ha bụ: n’aka ha onwe ha ka ikpe ha na mbuli elu ha si apụta. Ịnyịnya ha nile nwere ụkwụ nkọ karịa agụ, ha dịkwa nkọ karịa anụ ọhịa wolf nke anyasị; ndị ịnyịnya ha na-awụlikwa elu: ee, ndị ịnyịnya ha na-esi n’ebe dị anya bịa; ha na-efe dị ka ugo nke na-efe ngwa iri ihe. Ha nile na-abịa ime ihe ike; e dosiri ihu ha ike dị ka ifufe Ihu anyanwụ; ha wee chịkọta ndị a dọtara n’agha dị ka ájá. Ee, mba ahụ na-akwa ndị eze emo, ndị isi bụkwaara ya ihe ịchị ọchị: mba ahụ na-achị ebe ọ bụla e wusiri ike ọchị; n’ihi na ọ na-ekpokọba ájá, wee were ya. Mgbe ahụ ọ ga-efebiga dị ka ifufe, o wee gabiga, ikpe ama ya: ike ya nke a ewee ghọọ chi ya.”

  • Ogologo Oge Hà Aṅaa Fọdụụrụ Ndị Ajọ Omume?
    Ụlọ Nche—2000 | Febụwarị 1
    • 12. Gịnị bụ àgwà ndị Babilọn, ikpe gịnịkwa n’ezie ‘ga-ama’ ndị iro a na-emenye mmadụ ụjọ?

      12 Ndị agha Kaldea na-akwa ndị eze emo ma na-achị ndị isi ọchị, bụ́cha ndị na-apụghị igbochi ya ịga n’ihu. Ọ “na-achị ebe ọ bụla e wusiri ike ọchị,” n’ihi na ebe ọbụla e wusiri ike ga-ada mgbe ndị Babilọn ‘kpokọbara ájá’ site n’iwu mkputamkpu ájá ebe ha ga-esi wakpo ya. N’oge Jehova kara aka, ndị iro ahụ na-emenye mmadụ ụjọ “ga-efebiga dị ka ifufe.” N’ịwakpo Juda na Jerusalem, ‘ikpe ga-ama ya n’ezie,’ ikpe imejọ ndị Chineke. Mgbe ha nwesịrị mmeri dị ngwa, ọchịagha ndị Kaldea ga-etu ọnụ, sị: ‘Ike nke a bụ chi anyị.’ Ma lee ka o si bụrụ onye na-amachaghị ihe!

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya