-
“Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”Ụlọ Nche—1996 | Mach 1
-
-
11, 12. (a) Akụkụ ọzọ dị aṅaa nke amụma Zefanaịa ka e mezuworo n’ahụ ihe ahụ fọdụrunụ? (b) Olee otú ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ siworo ṅaa ntị n’òkù bụ́, “Ekwela ka aka gị abụọ kụdaa”?
11 Ihe ahụ fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi na-aṅụrị ọṅụ n’ịbụ ndị a napụtara na 1919 site ná ndọrọ n’agha ime mmụọ na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ha ahụwo mmezu nke amụma Zefanaịa: “Tie mkpu ọṅụ, gị ada Zaịọn; tie mkpu, gị Israel; ṅụrịa, were obi nile ṅụrịa ọṅụ agha, gị ada Jerusalem. Jehova ewezụgawo ikpe gị nile, Ọ chụghachiwo onye iro gị: Eze Israel, bụ́ Jehova, nọ n’etiti gị: ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. N’ụbọchị ahụ ka a ga-asị Jerusalem, Atụla egwu: gị Zaịọn, ekwela ka aka gị abụọ kụdaa. Jehova, bụ́ Chineke gị, nọ n’etiti gị, Ọ bụ dike nke na-azọpụta.”—Zefanaịa 3:14-17.
12 N’inwe nkwenyesi ike na ihe àmà bara ụba na Jehova nọ n’etiti ha, ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ agawo n’ihu n’ịrụzu ọrụ Chineke nyere ha n’atụghị egwu. Ha ekwusawo ozi ọma nke Alaeze ahụ, ha emewokwa ka a mara ikpe Jehova nile megide Krisendọm, ihe fọdụrụnụ na Babilọn Ukwu ahụ, na ajọ usoro ihe dum nke Setan. N’agbanyeghị ihe isi ike nile, n’ime ọtụtụ afọ iri gafeworonụ eri 1919, ha erubewo isi n’iwu Chineke ahụ bụ́: “Atụla egwu: gị Zaịọn, ekwela ka aka gị abụọ kụdaa.” Ha ewetulatabeghị aka ha n’ikesa ọtụtụ ijeri traktị, magazin, akwụkwọ, na akwụkwọ nta ndị na-ekwupụta Alaeze Jehova. Ha abụrụwo ihe nlereanya na-akpali okwukwe nye atụrụ ọzọ ahụ bụ́ ndị, kemgbe 1935, nuteworo n’akụkụ ha.
“Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”
13, 14. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị Juu ji laa azụ n’ijere Jehova ozi, oleekwa otú nke a si pụta ìhè? (b) Gịnị ka ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya nye anyị ime, n’ọrụ dịkwa aṅaa ka anyị na-ekwesịghị ikwe ka aka anyị kụdaa?
13 Ka anyị nọ ‘na-echere’ oké ụbọchị Jehova, olee otú anyị pụrụ isi nweta enyemaka bara uru site n’amụma Zefanaịa? Nke mbụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara iyi ndị Juu ahụ n’ụbọchị Zefanaịa bụ́ ndị lara azụ n’iso Jehova n’ihi na ha nwere obi abụọ banyere ịdị nso nke ụbọchị Jehova. Ndị Juu dị otú ahụ abụchaghị na ha kwupụtara obi abụọ ha n’ihu ọha, kama ụzọ ha si mee ihe gosiri na ha ekwetachaghị n’ezie na oké ụbọchị Jehova dị nso. Ha tinyere uche n’ịchịkọba akụ̀ na ụba kama ichere Jehova.—Zefanaịa 1:12, 13; 3:8.
14 Taa abụghị oge ikwe ka obi abụọ gbanye mkpọrọgwụ n’ime obi anyị. Ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya ịdị na-eyigharị ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’ime uche ma ọ bụ obi anyị. (2 Pita 3:1-4, 10) Anyị kwesịrị izere ịla azụ n’iso Jehova ma ọ bụ ‘ikwe ka aka anyị abụọ kụdaa’ n’ozi ya. Nke a na-agụnye ịghara iji “aka umengwụ arụ ọrụ” n’anyị ikwusa “ozi ọma” ahụ.—Ilu 10:4; Mak 13:10.
-
-
“Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”Ụlọ Nche—1996 | Mach 1
-
-
16. Gịnị bụ ọnọdụ uche nke ndị so na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm nwere, ma agbamume dị aṅaa ka Jehova na-enye anyị?
16 Enweghị mmasị bụ àgwà jupụtara taa n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, karịsịa ná mba ndị ka baa ọgaranya. Ọbụna ndị òtù nke chọọchị dị iche iche nke Krisendọm ekweghị nnọọ na Jehova Chineke ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ n’oge anyị. Ha na-eji ọchị nke ekweghị ekwe ma ọ bụ nzaghachi dị mkpirikpi bụ́ “enweghị m mmasị” ajụ mgbalị nile anyị na-eme iji ozi ọma nke Alaeze ahụ gakwuru ha! N’okpuru ọnọdụ ndị a, nnọgidesi ike n’ọrụ ịgba àmà ahụ pụrụ ịbụ ezi ihe ịma aka. Ọ na-etinye ntachi obi anyị n’ule. Ma site n’amụma Zefanaịa, Jehova na-enye ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi ume, na-asị: “Ekwela ka aka gị abụọ kụdaa. Jehova, bụ́ Chineke gị, nọ n’etiti gị, Ọ bụ dike nke na-azọpụta: Ọ ga-eji ọṅụ nwee obi ụtọ n’ahụ gị, Ọ ga-edere duu n’ịhụnanya Ya, Ọ ga-eji iti mkpu ọṅụ tegharịa egwu ọṅụ n’ahụ gị.”—Zefanaịa 3:16, 17.
17. Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka ndị dị ọhụrụ karị n’etiti atụrụ ọzọ ahụ kwesịrị ịgbaso, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
17 Ọ bụ eziokwu n’akụkọ ihe mere eme nke oge a nke ndị Jehova na ihe ahụ fọdụrụnụ, tinyekwara ndị meworo okenye karị n’etiti atụrụ ọzọ ahụ, arụzuwo ọrụ nchịkọta dị ukwuu na mgbe ikpeazụ ndị a. Ndị Kraịst a nile kwesịrị ntụkwasị obi egosiwo ntachi obi ha n’ime ọtụtụ afọ iri ndị gafeworonụ. Ha ekwebeghị ka enweghị mmasị n’akụkụ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ndị nọ na Krisendọm kụdaa ha aka. Ya mere ka ndị dị ọhụrụ karị n’etiti atụrụ ọzọ ahụ ghara ikwe ka enweghị mmasị n’ebe ihe ime mmụọ dị bụ́ nke jupụtara ebe nile taa n’ọtụtụ ala gbuo mmụọ ha. Ka ha ghara ikwe ka ‘aka ha abụọ kụdaa,’ ma ọ bụ daa mbà. Ka ha jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-eche Ụlọ Nche, Teta!, na mbipụta ndị ọzọ mara mma ndị a haziri kpọmkwem iji nyere ndị yiri atụrụ aka ịmụta eziokwu banyere ụbọchị Jehova na ngọzi ndị ga-esochi n’ihu ndị mmadụ.
-