-
Ụzọ E Si Eme Ka Nkekọ Alụmdi Na Nwunye Sie ikeỤlọ Nche—1993 | Ọgọst 15
-
-
Ndị Farisii rụrụ ụka na Mosis mere ndokwa maka ịgba alụkwaghịm site n’ikwu ka e nye “akwụkwọ nkewa.” Jisọs zaghachiri ha, sị: “Ọ bụ n’ihi obi etili unu ka Mosis kwere ka unu hapụ nwunye unu: ma site ná mmalite a dịghị eme otú a. Ma asị m unu, Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko, lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko.”—Matiu 19:3-9.
-
-
Ụzọ E Si Eme Ka Nkekọ Alụmdi Na Nwunye Sie ikeỤlọ Nche—1993 | Ọgọst 15
-
-
Ndokwa nke Iwu Mosis
N’oge e nyere Iwu Mosis, mmekọrịta alụmdi na nwunye adakpọwo n’ókè nke na Jehova, n’ihi obi ime etili nke ndị Israel, mere ndokwa maka ịgba alụkwaghịm. (Deuterọnọmi 24:1) Ọ bụghị nzube Chineke ka ndị Israel jiri iwu nke a nke ịgba nwunye ha alụkwaghịm mee ihe na-ezighị ezi n’ihi njehie ndị dị nta, dị ka ọ pụtara ìhè site n’iwu o nyere nke na ha ga-ahụ mmadụ ibe ha n’anya dị ka onwe ha. (Levitikọs 19:18) Ọbụna inye akwụkwọ ịgba alụkwaghịm jere ozi dị ka ihe mgbochi n’ihi na, dị ka akụkụ nke usoro ide akwụkwọ ahụ, di nke na-achọ ịgba alụkwaghịm aghaghị ijekwuru ndị ikom nwere ikike, bụ́ ndị ga-agba mbọ ịhụ na e kpeziri okwu ahụ. Ee e, Chineke enyeghị iwu a iji guzobe ikike ọ bụla mmadụ nwere ịgba nwunye ya alụkwaghịm “n’ihi ihe nile ọ bụla.”—Matiu 19:3.
Otú ọ dị, ndị Israel mesịrị leghara nzube nke iwu ahụ anya ma jiri ahịrị okwu nke a mere ihe mgbakwasị ụkwụ ịgba alụkwaghịm n’ihe ndabere ọ bụla masịrị mkpali ha. Ka ọ na-erule na narị afọ nke ise T.O.A., ha na-aghọ aghụghọ n’ebe nwunye ha lụrụ n’okorobịa nọ, na-agba ha alụkwaghịm n’ihi ihe nile ọ bụla. Jehova gwara ha okwu n’olu dị ike na ya kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị. (Malakaị 2:14-16) Ọ bụ n’ihi ọnọdụ ndị a mere Jisọs ji katọọ ịgba alụkwaghịm dị ka ndị Israel si eme ya n’ụbọchị ya.
-