-
Nye Aka Mee Ka Ọgbakọ Dịrị n’OtuNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
3. Gịnị ka ị ga-eme ma gị na nwanna nwee nghọtahie?
Ọ bụ eziokwu na anyị dị n’otu, ma anyị ezughị okè. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike mee ndị ọzọ ihe ha na-atụghị anya ya ma ọ bụdị mee ihe ga-ewute ha. Ọ bụ ya mere Okwu Chineke ji gwa anyị ka anyị ‘na-agbaghara ibe anyị.’ O kwukwara, sị: “Jehova gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.” (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.) Anyị enweghị ike ịgụta ugboro ole anyị na-emehie Jehova, ma, ọ na-agbaghara anyị. N’ihi ya, ọ chọrọ ka anyị na-agbaghara ụmụnna anyị. Ọ bụrụ na ị chọpụta na o nwere onye i mejọrọ, gakwuru ya ka unu kpezie.—Gụọ Matiu 5:23, 24.b
-
-
Nye Aka Mee Ka Ọgbakọ Dịrị n’OtuNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
Anyị na-emejọ ndị ọzọ mgbe ụfọdụ. Ọ dị otú ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Na vidio a anyị lere, gịnị ka otu nwanna nwaanyị mere ka ya na nwanna nwaanyị ọzọ dịrị ná mma?
-