-
Nchegbu Ọ̀ Na-egosi Enweghị Okwukwe?Teta!—2004 | Jun 8
-
-
Echiche nke Bible
Nchegbu Ọ̀ Na-egosi Enweghị Okwukwe?
“A MACHIBIDORO INWE NCHEGBU IWU.” Ná mmalite narị afọ nke 20, otu onye pastọ dere n’okpuru isiokwu a na inwe nchegbu maka ihe onwunwe abụghị nanị na o zighị ezi, kama na “ọ bụ mmehie dị oké njọ.” N’oge na-adịbeghị anya, otu onye na-ekiri ihe na-emenụ dere banyere imeri nchegbu na nchekasị, sị, “Inwe nchegbu na-egosi na anyị atụkwasịghị Chineke obi.”
Ebe ndị edemede abụọ ahụ gbakwasịrị ụkwụ wee ruo nkwubi okwu ha bụ n’Ozizi Elu Ugwu Jizọs, mgbe ọ sịrị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu.” (Matiu 6:25) Ebe ọ bụ na nchegbu na-emetụta nnọọ ọtụtụ mmadụ taa, anyị pụrụ ịjụ, sị: Onye Kraịst ò kwesịrị inwe obi amamikpe n’ihi ichegbu onwe ya? Mmadụ ichegbu onwe ya, ọ̀ na-egosi enweghị okwukwe?
-
-
Nchegbu Ọ̀ Na-egosi Enweghị Okwukwe?Teta!—2004 | Jun 8
-
-
Chineke Maara Ihe Ndị Na-akpa Anyị
Akwụkwọ Nsọ na-enyere anyị aka ịghọta ọdịiche dị n’etiti nchegbu nkịtị na mmehie nke enweghị okwukwe. E kwesịghị ile nchegbu a na-enwe kwa ụbọchị ma ọ bụ ọbụna enweghị okwukwe ruo nwa oge n’ihi adịghị ike nke mmadụ anya dị ka enweghị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ kpam kpam, bụ́ nke na-esite n’ajọ obi na-adịghị anabata ihe. Ya mere, ọ dịghị mkpa ka Ndị Kraịst na-enwe obi amamikpe nanị n’ihi na ha na-enwe nchegbu site n’oge ruo n’oge.
Otú o sina dị, ọ dị anyị mkpa ịkpachara anya ka nchegbu anyị ghara ịgabiga ókè ma na-achịkwazi ndụ anyị. N’ihi ya, Jizọs ji amamihe kwuo, sị: “Ya adịla mgbe unu ga-echegbu onwe unu wee sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyikwasị?’” O ji okwu nkasi obi sochie nke a, sị: “N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:25-33.
-