Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2021 | Mee
    • 3 Jizọs ma na ọtụtụ ndị agaghị ekweta na ọ bụ Mesaya ahụ. (Jọn 5:39-44) Ọ gwara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-adịghị ahụ ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ n’ebe m nọ.” (Mat. 11:2, 3, 6) Gịnị mere ọtụtụ ndị ekweghị na Jizọs?

  • Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2021 | Mee
    • (1) EBE JIZỌS SI

      Ebe Filip na-agwa Nataniel ka ọ gakwuru Jizọs n’ebe ọ nọ ọdụ n’ebe dị nso ebe ahụ.

      Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi ebe Jizọs si. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)b

      5. Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere ụfọdụ ndị ji chee na Jizọs abụghị Mesaya ahụ e buru n’amụma?

      5 Ebe Jizọs si mere ka ọtụtụ ndị sụọ ngọngọ. Ha kwetara na Jizọs na-akụzi ihe nke ọma, na-arụkwa ọtụtụ ọrụ ebube. Ma n’anya ha, Jizọs bụ naanị nwa ọkwá nkà. Ọ bụkwa onye Nazaret bụ́ obodo a na-ejighị kpọrọ ihe. Nataniel bụ́ onye mechara bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs jụdịrị, sị: “Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?” (Jọn 1:46) Ọ ga-abụ na Nataniel na-elelị obodo ahụ Jizọs si anya. O nwekwara ike ịbụ na o bu amụma ahụ e buru na Maịka 5:2 n’obi, ebe kwuru na ọ bụ na Betlehem ka Mesaya ga-esi pụta, ọ bụghị Nazaret.

      6. Gịnị gaara enyere ọtụtụ ndị aka n’oge Jizọs ịmata na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ?

      6 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Aịzaya onye amụma buru amụma na ndị iro Jizọs agaghị echegbu onwe ha “banyere ihe niile mere n’ọgbọ” Mesaya ahụ. (Aịza. 53:8) E buru amụma gbasara ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ. Ọ bụrụ na ha nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, ha gaara ahụ na e buru amụma na a ga-amụ Jizọs na Betlehem nakwa na ọ ga-esi n’agbụrụ Eze Devid. (Luk 2:4-7) N’ihi ya, a mụrụ Jizọs n’ebe ahụ e buru amụma ya na Maịka 5:2. Oleezi ihe bụ́ nsogbu? Ọ na-adịkarị ndị mmadụ ngwa ngwa ikwubi ihe. Ha aghọtaghị ihe niile merenụ. Ọ bụ ya mere ha ji sụọ ngọngọ.

  • Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2021 | Mee
    • (2) JIZỌS EKWEGHỊ ARỤ ỌRỤ EBUBE IJI GOSI ONWE YA

      Ebe Jizọs na-agwa ìgwè mmadụ okwu.

      Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi na Jizọs jụrụ ịrụ ọrụ ebube iji gosi onwe ya. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10)c

      9. Gịnị mere mgbe Jizọs jụrụ imere ndị mmadụ ihe ịrịba ama si n’eluigwe?

      9 N’oge Jizọs, ihe ọ kụziri ejughị ụfọdụ ndị afọ. Ha chọkwuru ihe ndị ọzọ. Ha gwara Jizọs ka o mee ihe “ịrịba ama si n’eluigwe” iji gosi na ọ bụ Mesaya. (Mat. 16:1) O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ na ha ghọtahiere ihe e kwuru na Daniel 7:13, 14. Ma, oge Jehova kara aka erubeghị ka amụma ahụ mezuo. Ihe Jizọs na-akụziri ha n’oge ahụ ezuola iji mee ka ha kweta na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ. Ma mgbe ọ jụrụ imere ha ihe ịrịba ama ndị ahụ ha chọrọ, ha sụrụ ngọngọ.—Mat. 16:4.

      10. Olee otú Jizọs si mezuo amụma Aịzaya onye amụma buru gbasara Mesaya?

      10 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Aịzaya buru amụma gbasara Mesaya, sị: “Ọ gaghị eti mkpu, ọ gaghị ekwu okwu n’olu dara ụda, ọ gaghịkwa eme ka a nụ olu ya n’okporo ámá.” (Aịza. 42:1, 2) Jizọs ejighị ozi o jere n’ụwa gosi onwe ya. Ọ rụghị ụlọ nsọ ndị buru ezigbo ibu. O yighị uwe e ji ama ndị isi okpukpe ma ọ bụkwanụ kwuo ka e tuo ya aha a na-etu ndị isi okpukpe. Mgbe a na-ekpe ya ikpe, ọ jụrụ ịrụ ọrụ ebube iji mee Herọd obi ụtọ n’agbanyeghị na e nwere ike iji maka ya gbuo ya. (Luk 23:8-11) Jizọs rụrụ ọrụ ebube ụfọdụ. Ma, ihe bụ́ mkpa ya bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụ n’ihi nzube a ka m ji bịa.”—Mak 1:38.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya