-
Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2021 | Mee
-
-
3 Jizọs ma na ọtụtụ ndị agaghị ekweta na ọ bụ Mesaya ahụ. (Jọn 5:39-44) Ọ gwara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-adịghị ahụ ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ n’ebe m nọ.” (Mat. 11:2, 3, 6) Gịnị mere ọtụtụ ndị ekweghị na Jizọs?
-
-
Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2021 | Mee
-
-
(1) EBE JIZỌS SI
Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi ebe Jizọs si. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)b
5. Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere ụfọdụ ndị ji chee na Jizọs abụghị Mesaya ahụ e buru n’amụma?
5 Ebe Jizọs si mere ka ọtụtụ ndị sụọ ngọngọ. Ha kwetara na Jizọs na-akụzi ihe nke ọma, na-arụkwa ọtụtụ ọrụ ebube. Ma n’anya ha, Jizọs bụ naanị nwa ọkwá nkà. Ọ bụkwa onye Nazaret bụ́ obodo a na-ejighị kpọrọ ihe. Nataniel bụ́ onye mechara bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs jụdịrị, sị: “Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?” (Jọn 1:46) Ọ ga-abụ na Nataniel na-elelị obodo ahụ Jizọs si anya. O nwekwara ike ịbụ na o bu amụma ahụ e buru na Maịka 5:2 n’obi, ebe kwuru na ọ bụ na Betlehem ka Mesaya ga-esi pụta, ọ bụghị Nazaret.
6. Gịnị gaara enyere ọtụtụ ndị aka n’oge Jizọs ịmata na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ?
6 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Aịzaya onye amụma buru amụma na ndị iro Jizọs agaghị echegbu onwe ha “banyere ihe niile mere n’ọgbọ” Mesaya ahụ. (Aịza. 53:8) E buru amụma gbasara ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ. Ọ bụrụ na ha nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, ha gaara ahụ na e buru amụma na a ga-amụ Jizọs na Betlehem nakwa na ọ ga-esi n’agbụrụ Eze Devid. (Luk 2:4-7) N’ihi ya, a mụrụ Jizọs n’ebe ahụ e buru amụma ya na Maịka 5:2. Oleezi ihe bụ́ nsogbu? Ọ na-adịkarị ndị mmadụ ngwa ngwa ikwubi ihe. Ha aghọtaghị ihe niile merenụ. Ọ bụ ya mere ha ji sụọ ngọngọ.
-
-
Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2021 | Mee
-
-
(2) JIZỌS EKWEGHỊ ARỤ ỌRỤ EBUBE IJI GOSI ONWE YA
Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi na Jizọs jụrụ ịrụ ọrụ ebube iji gosi onwe ya. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10)c
9. Gịnị mere mgbe Jizọs jụrụ imere ndị mmadụ ihe ịrịba ama si n’eluigwe?
9 N’oge Jizọs, ihe ọ kụziri ejughị ụfọdụ ndị afọ. Ha chọkwuru ihe ndị ọzọ. Ha gwara Jizọs ka o mee ihe “ịrịba ama si n’eluigwe” iji gosi na ọ bụ Mesaya. (Mat. 16:1) O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ na ha ghọtahiere ihe e kwuru na Daniel 7:13, 14. Ma, oge Jehova kara aka erubeghị ka amụma ahụ mezuo. Ihe Jizọs na-akụziri ha n’oge ahụ ezuola iji mee ka ha kweta na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ. Ma mgbe ọ jụrụ imere ha ihe ịrịba ama ndị ahụ ha chọrọ, ha sụrụ ngọngọ.—Mat. 16:4.
10. Olee otú Jizọs si mezuo amụma Aịzaya onye amụma buru gbasara Mesaya?
10 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Aịzaya buru amụma gbasara Mesaya, sị: “Ọ gaghị eti mkpu, ọ gaghị ekwu okwu n’olu dara ụda, ọ gaghịkwa eme ka a nụ olu ya n’okporo ámá.” (Aịza. 42:1, 2) Jizọs ejighị ozi o jere n’ụwa gosi onwe ya. Ọ rụghị ụlọ nsọ ndị buru ezigbo ibu. O yighị uwe e ji ama ndị isi okpukpe ma ọ bụkwanụ kwuo ka e tuo ya aha a na-etu ndị isi okpukpe. Mgbe a na-ekpe ya ikpe, ọ jụrụ ịrụ ọrụ ebube iji mee Herọd obi ụtọ n’agbanyeghị na e nwere ike iji maka ya gbuo ya. (Luk 23:8-11) Jizọs rụrụ ọrụ ebube ụfọdụ. Ma, ihe bụ́ mkpa ya bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụ n’ihi nzube a ka m ji bịa.”—Mak 1:38.
-