Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Nwere Ihe Dị Ukwuu Ọ Pụtara Nye Gị
    Ụlọ Nche—2003 | Eprel 1
    • Otú ahụ ka ọ dịkwa iko mmanya ahụ. Jizọs sịrị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke na-adabere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.”—Luk 22:20.

      N’ihe ndekọ Matiu, Jizọs kwuru banyere iko ahụ, sị: “Nke a pụtara ‘ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.” (Matiu 26:28) Jizọs ji mmanya dị n’ime iko ahụ na-eme ihe dị ka ihe nnọchianya nke ọbara ya. Ọbara ya a wụsịrị gaje ịbụ ihe ndabere nke “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” nke ga-adị n’etiti ya na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ, bụ́ ndị ga-eso ya chịa dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe.—Jeremaịa 31:31-33; Jọn 14:2, 3; 2 Ndị Kọrint 5:5; Mkpughe 1:5, 6; 5:9, 10; 20:4, 6.

      Mmanya dị n’iko ahụ bụkwa ihe ncheta na ọbara Jizọs a wụsịrị ga-abụ ihe ndabere maka “mgbaghara mmehie,” si otú ahụ na-emeghe ụzọ maka ndị na-ekere òkè na ya ịbụ ndị a kpọrọ ibi ndụ n’eluigwe dị ka ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe. N’ụzọ kwere nghọta, ọ bụ nanị ndị nwere ọkpụkpọ eluigwe a—ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè—na-ekere òkè n’achịcha ahụ na mmanya ahụ n’oge Ememe Ncheta.—Luk 12:32; Ndị Efesọs 1:13, 14; Ndị Hibru 9:22; 1 Pita 1:3, 4.

      Otú ọ dị, gịnịkwanụ banyere ụmụazụ Jizọs nile na-anọghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? Ndị a bụ “atụrụ ọzọ” nke Onyenwe anyị, bụ́ ndị na-atụ anya, ọ bụghị iso Kraịst chịa n’eluigwe, kama inweta ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. (Jọn 10:16; Luk 23:43; Mkpughe 21:3, 4) Dị ka “oké ìgwè mmadụ” nke Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị ‘na-ejere Chineke ozi dị nsọ ehihie na abalị,’ obi dị ha ụtọ ịbụ ndị ji ekele na-ekiri ihe na-emenụ n’oge Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, site n’okwu ọnụ na n’omume ha, ha na-asị: “Nzọpụta anyị sitere n’aka Chineke anyị, bụ́ onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, sitekwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.”—Mkpughe 7:9, 10, 14, 15.

  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Nwere Ihe Dị Ukwuu Ọ Pụtara Nye Gị
    Ụlọ Nche—2003 | Eprel 1
    • [Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6]

      Ọ̀ BỤ “NKE A BỤ AHỤ́ M” KA Ọ̀ BỤ “NKE A PỤTARA AHỤ́ M”?

      Mgbe Jizọs sịrị, “Abụ m ọnụ ụzọ” na, “Abụ m ezi osisi vaịn ahụ,” ọ dịghị onye chere na ọ bụ ọnụ ụzọ nkịtị ma ọ bụ osisi vaịn nkịtị. (Jọn 10:7; 15:1) N’otu aka ahụ, mgbe The New Jerusalem Bible kwuru na Jizọs sịrị: “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ,” anyị adịghị ekwubi na iko ahụ n’onwe ya bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’ụzọ nkịtị. Ya mere, n’otu aka ahụ, mgbe ọ sịrị na achịcha ahụ ‘bụ’ ahụ́ ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na achịcha ahụ pụtara, ma ọ bụ na-anọchi anya, ahụ́ ya. N’ihi ya, nsụgharị nke Charles B. Williams na-asị: “Nke a na-anọchi anya ahụ́ m.”—Luk 22:19, 20.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya