Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Ọchịchị n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ
    Ụlọ Nche—1995 | Julaị 15
    • Ntakịrị oge mgbe baptism ya gasịrị, otu mmụọ e kere eke anya na-adịghị ahụ a na-akpọ Setan Ekwensu nwara Jisọs ọnwụnwa. N’ihota otu n’ime ọnwụnwa ndị ahụ, Bible na-asị: “Ekwensu kuuru [Jisọs] gaa ugwu dị nnọọ oké elu, wee gosi Ya alaeze nile nke ụwa, na ebube ha.” (Matiu 4:8) Setan gwaziri Jisọs, sị: “Gị ka m ga-enye ike a nile, na ebube ha: n’ihi na a rarawo ya nye n’aka m; onye ọ bụla m chọkwara inye ya m nye ya. Ya mere ọ bụrụ na Gị onwe gị ga-akpọ isiala n’ihu m, ihe a nile ga-abụ nke Gị.”—Luk 4:6, 7.

      Setan zọọrọ na ya nwere ike n’elu alaeze, ma ọ bụ gọọmenti nile, nke ụwa nke a. Jisọs ọ̀ gbaghara nzọrọ a? Ee e. N’ezie, ọ kwadoro ya ịbụ eziokwu n’oge ọzọ site n’izo aka n’ebe Setan nọ dị ka “onye isi nke ụwa.”—Jọn 14:30.

      Dị ka Bible si kwuo, Setan bụ mmụọ ozi ọjọọ nke nwere ike dị ukwuu. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi jikọrọ Setan na “ndị agha mmụọ nke ajọ ihe” ma kwuo banyere ha dị ka “ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a.” (Ndị Efesọs 6:11, 12) E wezụga nke ahụ, Jọn onyeozi sịrị na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-ekwu na Setan “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) N’okwu ihe atụ, Mkpughe na-egosikwa Setan dị ka dragọn nke na-enye usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa “ike ya, na ocheeze ya, na oké ịchịisi.”—Mkpughe 13:2.

      Ihe ndị na-eme n’ụwa na-agbakwa akaebe na e nwere ike ọjọọ na-arụ ọrụ, na-akpali ụmụ mmadụ imerụ onwe ha ahụ. Gịnị ọzọ mere ka gọọmenti ụmụ mmadụ ghara inwe ike ime udo? Gịnị ọzọ ga-akpata ndị mmadụ ịkpọ ibe ha asị na igbu ibe ha? N’ịbụ onye nwere mgbagwoju anya site n’oké mgbukpọsị na ọnwụ e nwere n’otu agha obodo, otu onye hụrụ ihe merenụ sịrị: “Amaghị m otú ihe a pụrụ isiworị mee. Ọ bụ ihe karịrị ịkpọasị. Ọ bụ mmụọ ọjọọ na-eji ndị mmadụ a eme ihe iji bibie ibe ha.”

  • Ndị Ọchịchị n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ
    Ụlọ Nche—1995 | Julaị 15
    • Ihe Mere E Jiworo Nye Setan Ohere Ịchị

      Ì chetara ihe Setan gwara Jisọs banyere ịchịisi n’elu ụwa? “Gị ka m ga-enye ike a nile . . . n’ihi na a rarawo ya nye n’aka m,” ka Setan kwuru. (Luk 4:6) Okwu ahụ na-egosi na Setan Ekwensu na-akpa ike nanị site na Chineke ikwe ka o mee otú ahụ. Ma gịnị mere Chineke ji kwere ka Setan dịrị?

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya