Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Inyom Bụ́ Ndị Kraịst Kwesịrị Nsọpụrụ na Nkwanye Ùgwù
    Ụlọ Nche—1995 | Julaị 15
    • 1, 2. (a) Mkparịta ụka Jisọs na nwanyị Sameria ahụ n’akụkụ olulu mmiri kpaliri nchegbu dị aṅaa, n’ihi gịnịkwa? (Leekwa nkọwa ala ala peji.) (b) Site n’ikwusara nwanyị Sameria ahụ ozi ọma, gịnị ka Jisọs gosipụtara?

      N’OLULU mmiri ochie ahụ dị nso obodo Saịka n’otu ehihie ka 30 O.A. na-achọ ịgwụsị, Jisọs kpughere uche ya banyere ụzọ e kwesịrị isi mesoo ndị inyom. O jiwo ụkwụ gaa njem ụtụtụ nile gabiga mba Sameria ahụ bụ ugwu ugwu ma rute n’olulu mmiri ahụ n’ike ọgwụgwụ, agụụ, na n’akpịrị ịkpọ nkụ. Ka ọ nọdụrụ ala n’akụkụ olulu mmiri ahụ, otu nwanyị Sameria bịara ikurutụ mmiri. “Nye m mmiri ka m ṅụọ,” ka Jisọs gwara ya. Nwanyị ahụ aghaghị imoropụwo anya na-ele ya n’ijuanya. Ọ jụrụ, sị: “Gị onwe gị si aṅaa arịọ mmiri n’aka m ka Ị ṅụọ, ebe Ị bụ Onye Juu, ma mụ bụ nwanyị Sameria?” E mesịa, mgbe ndị na-eso ụzọ ya si n’ịga zụta ihe oriri lata, ha nwere ijuanya, na-achịgharị n’uche ihe mere Jisọs “na nwanyị na-ekwurịta okwu.”—Jọn 4:4-9, 27.

      2 Gịnị kpaliri ajụjụ nwanyị a na nchegbu ndị na-eso ụzọ ahụ? Ọ bụ onye Sameria, ndị Sameria na ndị Juu adịghịkwa emekọ ihe. (Jọn 8:48) Ma ihe àmà na-egosi na e nwere ihe ọzọ kpatara nchegbu. N’oge ahụ, ọdịnala ndị rabaị kụdara ndị ikom aka ikwunyere ndị inyom okwu n’ihu ọha.a Ma, Jisọs kwusaara nwanyị a nwere ezi obi ozi ọma n’ihu ọha, ọbụna na-ekpughere ya na ya bụ Mesaịa ahụ. (Jọn 4:25, 26) Jisọs si otú ahụ gosi na ọdịnala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, gụnyere ndị wedara ndị inyom ala, agaghị ejichi ya. (Mak 7:9-13) N’ụzọ megidere nke ahụ, site n’ihe o mere na site n’ihe o ziri, Jisọs gosipụtara na e kwesịrị imeso ndị inyom n’ụzọ nsọpụrụ na n’ụzọ dị ùgwù.

  • Ndị Inyom Bụ́ Ndị Kraịst Kwesịrị Nsọpụrụ na Nkwanye Ùgwù
    Ụlọ Nche—1995 | Julaị 15
    • a The International Standard Bible Encyclopedia na-akọwa, sị: “Ndị inyom adịghị eso ndị ọbịa bụ́ ndị ikom erikọ nri, a kụdakwara ndị ikom aka ikwunyere ndị inyom okwu. . . . Iso nwanyị kparịta ụka n’ebe ọha mmadụ nọ na-akpalitekarị akụkọ ọjọọ.” Akwụkwọ The Mishnah nke ndị Juu, nchịkọta nke nkụzi ndị rabaị, dụrụ ọdụ, sị: “Ekwunyerela nwanyị okwu nke ukwuu. . . . Onye na-ekwunyere nwanyị okwu nke ukwuu na-ewetara onwe ya ihe ọjọọ ma na-eleghara ihe ọmụmụ nke Iwu ahụ anya, n’ikpeazụkwa ọ ga-eketa Gehena.”—Aboth 1:5.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya