-
Eze Alaeze Chineke Emeela Ka A Ghọtakwuo Ihe Gbasara Alaeze AhụAlaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
3, 4. (a) Olee otú Jizọs si na-akụziri ezigbo ndị na-eso ụzọ ya ihe gbasara Alaeze Chineke? (b) Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?
3 Jizọs kwuru ihe ahụ e dere na Jọn 16:12 n’abalị ikpeazụ tupu e gbuo ya. Mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, olee otú ọ ga-esi na-akụziri ezigbo ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere Alaeze Chineke? Ọ gwara ndịozi ya, sị: “Mmụọ nke eziokwu ahụ . . . ga-eduzi unu wee nyere unu aka ịghọta eziokwu niile.”a (Jọn 16:13) Anyị nwere ike ikwu na mmụọ nsọ bụ ihe Jizọs ji na-ezi anyị ihe nwayọọ nwayọọ. O ji ya na-akụziri anyị ihe ọ bụla anyị kwesịrị ịma gbasara Alaeze Chineke. Ọ na-akụziri anyị ihe ndị ahụ mgbe ọ ma na anyị ga-aghọtali ha.
-
-
Eze Alaeze Chineke Emeela Ka A Ghọtakwuo Ihe Gbasara Alaeze AhụAlaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
a Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na okwu Grik a kpọrọ “ga-eduzi” n’amaokwu a pụtara “igosi mmadụ ụzọ.”
-