Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Geenụ M Ntị Ka M Gwa Unu Ihe Merenụ”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • 11. Olee ihe ndị okenye gwara Pọl ka o mee, oleekwa ihe ọ ga-abụ na o meghị? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

      11 Ọ bụ eziokwu na asịrị a na-akọ banyere Pọl ekwesịghị ekwesị, ma o nyere ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst nsogbu n’obi. N’ihi ya, ndị okenye ahụ gwara Pọl, sị: “Anyị nwere ụmụ nwoke anọ ndị chọrọ imezu nkwa ha kwere Chineke. Kpọrọ ụmụ nwoke ndị a gaa ka gị na ha sachaa onwe unu otú iwu kwuru, kwụọkwa ụgwọ ihe niile ọ ga-efu ha, ka e wee kpụọ ha isi. Onye ọ bụla ga-esikwa otú a mara na ihe ahụ ndị mmadụ na-akọ banyere gị abụghị eziokwu, kama na ị na-eme ihe kwesịrị ekwesị, na-edebekwa Iwu Mosis.”c​—Ọrụ 21:23, 24.

      12. Olee otú Pọl si gosi na ya dị njikere ime ihe ndị okenye nọ na Jeruselem gwara ya?

      12 Pọl gaara agwa ha na ihe bụ́ nsogbu bụ na ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst na-anụrụ Iwu Mosis ọkụ n’obi, ọ bụghị asịrị a na-akọ banyere ya. Kama ime otú ahụ, ọ dị njikere ime ihe ndị okenye ahụ gwara ya ebe ọ bụ na e nweghị iwu Chineke ọ ga-emebi. Tupu mgbe ahụ, o dere, sị: “M gakwuru ndị na-edebe Iwu Mosis, mụ emewe ka onye na-edebe Iwu Mosis iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs, ọ bụ eziokwu na iwu ejighị m idebe Iwu Mosis.” (1 Kọr. 9:20) N’okwu a, Pọl kwetara ime ihe ndị okenye nọ na Jeruselem gwara ya mee. O mere ka “onye na-edebe Iwu Mosis.” Taa, anyị kwesịrị ịna-eme ka Pọl, na-eme ihe ndị okenye gwara anyị, ọ bụghị isi ọnwụ na-eme ihe otú masịrị anyị.​—Hib. 13:17.

      Foto ndị na-egosi: 1. Ebe Pọl na-ege ntị ndị okenye nọ na Jeruselem ntị mgbe ha na-agwa ya ihe ọ ga-eme. 2. Ebe ndị okenye na-enwe nnọkọ n’oge anyị a, otu okenye ana-eleru anya ka ndị okenye ibe ya na-eweli aka.

      Mgbe a gwara Pọl mee ihe na-emebighị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, o kwetara mee ya. Ị̀ na-eme ka ya?

      IWU NDỊ ROM NA ỤMỤ AMAALA ROM

      Ndị ọchịchị Rom anaghị etinyecha anya n’ihe ndị ọchịchị ime obodo na-eme n’ebe ndị ha na-achị. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ iwu ndị Juu ka ndị Juu na-eso. Naanị ihe mere ndị Rom ji tinye ọnụ n’okwu Pọl bụ na ọgba aghara ahụ e nwere mgbe ọ gara n’ụlọ nsọ nwere ike ịkpata aghara n’obodo ahụ niile.

      Ọ bụ ndị ọchịchị Rom na-atụrụ ndị na-abụghị ụmụ amaala Rom bi n’obodo ndị Rom na-achị ihe ha na-eme. Ma, otú ha si emeso ụmụ amaala Rom na-adị iche.f E nwere ụfọdụ uru mmadụ na-erite ma ọ bụrụ nwa amaala Rom, a na-akwanyekwara ya ùgwù n’alaeze ukwu ahụ niile. Dị ka ihe atụ, iwu akwadoghị ka e kee onye Rom agbụ ma ọ bụ kụọ ya ihe ma ọ bụrụ na a mabeghị ya ikpe n’ihi na ọ bụ naanị ndị ohu ka a na-eme otú ahụ. Ụmụ amaala Rom nwekwara ikike ikwu ka eze ukwu nọ na Rom kpegharịa ikpe gọvanọ na-achị ógbè ha kpere ha.

      E nwere ọtụtụ ụzọ mmadụ nwere ike isi bụrụ nwa amaala Rom. Nke mbụ bụ ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ya bụ ụmụ amaala Rom. Mgbe ụfọdụ, eze ukwu Rom na-eme ụfọdụ ndị ma ọ bụ ndị niile bi n’obodo ma ọ bụkwanụ ndị niile bi n’ógbè ụmụ amaala Rom n’ihi ọrụ ha rụrụ. Ndị ohu bi n’ebe ndị ahụ anaghị eso ná ndị a na-eme ụmụ amaala Rom. Ma, ọ bụrụ na ohu akwụọ ụgwọ iji nwere onwe ya n’aka nwa afọ Rom ma ọ bụ na nna ya ukwu bụ́ onye Rom agwa ya na o nwerela onwe ya ma ọ bụkwanụ ọ bụrụ na onye agha na-abụghị onye Rom nke so ndị agha Rom lụọ agha alaa ezumike nkà, o nwere ike ịbụ nwa amaala Rom. Ọ ga-abụkwa na e nwere ihe ụfọdụ nwere ike ime ka mmadụ jiri ego zụta ikike ịbụ nwa amaala Rom. Ọ bụ ya mere ọchịagha bụ́ Klọdiọs Laịsias ji gwa Pọl, sị: “Akwụrụ m ezigbo ụgwọ tupu mụ abụrụ onye Rom.” Pọl asị ya: “Mụnwa bụ onye Rom kemgbe a mụrụ m.” (Ọrụ 22:28) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na e nwere otú otu n’ime ndị nna nna Pọl si nweta ikike ịbụ nwa amaala Rom, ma anyị amaghị otú o si nweta ya.

      f N’oge ndịozi, ọtụtụ ndị bi na Judia abụghị ụmụ amaala Rom. Ma mgbe ihe dị ka narị afọ abụọ gachara, e nyere ndị niile bi n’obodo ndị Rom na-achị ikike ịbụ ụmụ amaala Rom.

  • “Geenụ M Ntị Ka M Gwa Unu Ihe Merenụ”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • c Ndị ọkà mmụta kwuru na ụmụ nwoke ahụ kwere nkwa ịbụ ndị Naziraịt. (Ọnụ Ọgụ. 6:1-21) Ma, a kagbuola Iwu Mosis nke mere mmadụ ga-eji kwe nkwa ịbụ onye Naziraịt. N’agbanyeghị ya, ọ ga-abụ na Pọl chere na ọ bụghị ihe ọjọọ ma ụmụ nwoke ahụ mezuo nkwa ha kwere Jehova. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ọjọọ ma o soro ha gaa ma kwụọrọ ha ụgwọ ihe ha mefuru. Anyị amaghị kpọmkwem ụdị nkwa ha kwere, ma nke ọ bụla ọ bụ, o doro anya na Pọl agaghị akwado ka ụmụ nwoke ahụ jiri anụmanụ chụọ àjà (otú ndị Naziraịt na-eme), chee na ọ ga-asachapụ mmehie ha. Àjà ụmụ anụmanụ enweghịzi ike ikpuchi mmehie ebe ọ bụ na Kraịst ejirila ndụ ya zuru okè chụọ àjà. Anyị amaghị ihe niile Pọl mere n’okwu a, ma anyị ji n’aka na ọ gaghị ekweta ime ihe ọ bụla ga-emebi akọnuche ya.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya