-
“Ha Bụ Ndị Nkịtị Na-agụghị Akwụkwọ”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
1, 2. Olee ọrụ ebube Pita na Jọn rụrụ mgbe ha rutewere n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ụlọ nsọ?
ÌGWÈ mmadụ nọ na-agagharị ka anwụ na-achasi ike n’ehihie. Ndị Juu bụ́ ndị ji obi ha niile na-efe Chineke nakwa ndị na-eso ụzọ Kraịst na-abanye n’ogige ụlọ nsọ. Ọ fọrọ obere ka ‘oge e ji ekpe ekpere’ ruo.a (Ọrụ 2:46; 3:1) Pita na Jọn so n’ìgwè mmadụ ahụ. Ha gawara n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ nsọ a na-akpọ Ọnụ Ụzọ Mara Mma. N’agbanyeghị ụzụ ndị mmadụ na-eme nakwa mkpọtụ ụkwụ ndị na-agafe agafe na-eme, otu onye arịrịọ karịrịla afọ iri anọ, onye dara ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya, nọ ebe ahụ na-arịọ ndị mmadụ ego.—Ọrụ 3:2; 4:22.
-
-
“Ha Bụ Ndị Nkịtị Na-agụghị Akwụkwọ”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
a A na-ekpe ekpere n’ụlọ nsọ mgbe a na-achụ àjà ụtụtụ na nke mgbede. A na-achụ àjà mgbede “n’awa nke itoolu,” ma ọ bụ n’ihe dị ka elekere atọ nke ehihie.
-