-
“Chineke Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
1-3. Olee ọhụụ Pita hụrụ, gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta ihe ọ pụtara?
AKỤKỌ a mere n’afọ 36 O.A. Anwụ ọkọchị nọ na-acha Pita ka ọ nọ na-ekpe ekpere n’elu ụlọ dị larịị, nke dị nso n’ọdụ ụgbọ mmiri Jọpa. Ọ bụ ọbịa n’ụlọ ahụ kemgbe ụbọchị ole na ole. Ma ó nweghị ihe ọzọ, ọnụnọ ọ nọ ebe ahụ gosiri na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu. Aha onye nwe ụlọ ahụ bụ Saịmọn. Aka ọrụ ya bụ isiji akpụkpọ anụ. Ọ bụghịkwa ndị Juu niile ga-ekwe ịnọ n’ụlọ ya.a Ka o sina dị, ọ dị ihe dị mkpa Pita na-aga ịmụta, nke ga-egosi na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu.
-
-
“Chineke Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
a Ụfọdụ ndị Juu na-ele onye na-esiji akpụkpọ anụ anya ọjọọ, n’ihi na ọrụ ahụ na-eme ka ọ na-emetụ akpụkpọ anụ, ozu anụmanụ, na ihe na-asọ oyi ndị e ji arụ ya aka. A naghị ekwe ka ndị na-esiji akpụkpọ anụ bata n’ụlọ nsọ Chineke. A naghị ekwe ka ha nọrọ n’ebe na-erughị iri kubit ise, ma ọ bụ ihe karịrị iri amaụkwụ asaa, n’obodo. O nwere ike iso n’ihe mere ụlọ Saịmọn ji dịrị “n’akụkụ oké osimiri.”—Ọrụ 10:6.
-